Full Lyrics
VERSE 1
Abụ m Okwu si n'igwe gbadata.
Okwu si n'igwe bịa.
Okwu n'enye ndụ ebighị ebi.
Chi zitere m'o!
Abụ m Okwu si n'igwe gbadata.
Okwu si n'igwe bịa.
Ka ndị eji eji nwer'onwe ha.
Chi zitere m'o!
REFRAIN
Chukwu zitere m'o!
Chi zitere m'o!
Ka m butere ndị ogbenye Oziọma.
Chi zitere m'o!
Ka m nyere ndị nọ na mkpa aka.
Chi zitere m'o!
TENOR / BASS
Abụ m ezi achịcha nke si n'igwe,
onye riri M g'adigide ndụ, anwụghị anwụ!
Mu n'onwe m zur'oke
Na Eucharistia, ma n'iberibe achịcha, ma n'obere mmanya!
Nwa m, nar'achịcha m rie,
Ahụ m'o! Ahụ m'o!
Nara iko mmanya M ṅụọ,
Ọbara m'o! Ọbara m'o!
VERSE 2
Abụ m Okwu si n'igwe gbadata.
Okwu si n'igwe bịa.
Ka ndị kpur'isi hụb'ụzọ.
Chi zitere m'o!
Abụ m Okwu si n'igwe gbadata.
Okwu si n'igwe bịa.
Ka ndị a n'akpagbu nwer'onwe ha.
Chi zitere m'o!