Full Lyrics
INTRO
Dozie! Dozie! Dozie! Chukwu dozie! Chukwu nọ n'Orinnsọ
Ka ahụ na Ọbara Gị m naanata gbanwoo mo, saachaa so mo!
Ka ahụ na Ọbara Gị oh Chineke nụchaa mo, saachaa mo!
Ka ahụ na Ọbara Gị m naanata doo m nsọ O! m ka m dị ọcha
Ka ahụ na Ọbara Gị m naanata doo m nsọ O! m ka m dị ọcha,
Onye ndozi!
VERSE 1
Ike a gwụgo mo! Ike a gwụgo mo! Ike a gwụgo mo! imejọzi Gị Jeeso mo!
Weerenu amara Gị jidesienụ m ike,
Dozie ndụ m, ka m bụrụ nke Gị o!
VERSE 2
Oteela m chọbara ka mụ na Gị dozie,
ma ụtọ njọ ekweghị m ka m kwụdosie ike,
nyerenu m'aka ka m mebe uche Gị,
belatara m oliwarawara, oliwarawara nke njọ!
VERSE 3
Mgbe ebilimmiri nkụwa na efegharị mo!,
Mgbe ọnwụ nwa nk'ụwana atụgharị mo,
jidesienụ m'ike! jidesienụ m'ike ka m gharịda;
Chukwu naedozi ihe nile!
REFRAIN
Dozienu mo! O! Onye ndozi! dozi!
Dozienu mo! O! Onye ndozi! dozi!
mo! Dozie! Chukwu dozie, mee m ka m mara Gị
Olisa dozie ife naeser'anyị o!
Dozienụ ndụ mo! nyenụ m ndụ ọhụrụ,
Dozienụ ndụ mo! onye I doziri onwee mgbanwe
Ọkwa Gị doziri ndụ Meri Magdalin?
Ọkwa Gị doziri ndụ nwanyị ọruru ọbara?
Zakịọsụ zutere Gị, ị nye ya nzọpụta
Sọọlụ zutere Gị, ị gbanweere ya aha,
nwanyị Sameria zutere Gị o! ị gbanweere ya ọnọdụ.
Lezianụ mo, Chi mo! Lezianụ mo Chi mo!
Dozienu mo! O! Onye ndozi!
Dozienu mo! O! Onye ndozi!