EKWERE M N'OTU CHINEKE by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Creed (I believe) Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN 1 Ekwere m n'otu Chineke, Nna, onye jike nile. Ekwere m n'otu Chineke, Nna, onye jike nile. VERSE 1 Onye mere igwe n'ala, n'ihe nile a naahu anya na ndi a naghi ahu anya. Ya n'otu Onyenwe anyi, Jesu Kristi, s'otu Nwa Chineke muru. Nna muru t'uwa tiwa nile Chukwu si na Chukwu, ihe si n'ihe. Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu. A muru Ya amu, e meghi Ya eme, Ya na Nna bu otu n'ihe ho ji buru Chukwu. Onye si na Ya mee ihe nile, Onye mak'ihi anyi bu mmadu. Na mak'ihi nzoputa anyi, siri n'eligwe gbadata. AD LIBITUM A CAPPELLA O wer'ahu na Virgin Maria Site na Muo Nso: O buru mmadu. A bia kpogbuo Ya n'obe, A bia kpogbuo Ya n'obe n'ihi anyi N'oge ochichi Pontus Pilate O tahuhu, O tahuhu, E nwuo, E lie Ya. VERSE 2 Ma O bilitere n'ubochi nk'ato ka akwukwo nso siri kwu. REFRAIN 2 O bilitere n'onwu, O bilitere n'onwu O rogoro n'eligwe Noro n'aka nri Nna. VERSE 3 Ma O g'abiaghachi ozo n'ebube Ya ikpe ndi ndu na ndi nwuru anwu ikpe. Onye ochichi Ya enweghi njedebe. Ekwere m na Muo Nso, Onyenwe anyi n'enye ndu, Onye si na Nna na Nwa puta, Onye a n'esekpuru. N'etokodo Ya na Nna na Nwa: Onye si na ndi amuma kwuokwu. Ekwem n'otu nzuko aso Katolik, n'Apostolik. Ekwuputa m'otu Baptisma nke mgbaghara njo. ENDING Anam atu anya, Anam atu anya Mbilite n'onwu ndi nwuru anwu Na ndu uwa g'abianu. Amen. Amen. Amen. Amen. Amen.

Download the sheet music

EKWERE M N'OTU CHINEKE

EKWERE M N'OTU CHINEKE

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
1 page
13 Downloads
Creed (I believe)
0 0

More lyrics you may want