OTITO DIRI CHINEKE by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Gloria Vernacular Masses Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Otito diri Chineke N'elu kach'elu n'uwa REFRAIN Udo diri mmadu ndi nwere obioma VERSE 1 Anyi ajaa Gi nma Anyi agozie Gi Anyi esekpu oro Gi Anyi etoo Gi Anyi ekele Gi n'ihi nnukwu ebube Gi VERSE 2 Oseb'luwa Chukwu Eze nke Eligwe Chukwu Nna Omejike nile Dinwenu Jesu Kristi S'otu Nwa Chineke muru VERSE 3 Dinwenu Chukwu Nwaturu nke Chineke Nwa nke Nna Gi onye nekpochapu njo nk'uwa meere anyi ebere VERSE 4 Gi onye nekpochapu njo nk'uwa nara aririo anyi Gi onye no n'aka nri Nna meer'anyi ebere N'ihi na so Gi di nso so Gi bu Dinwenu VERSE 5 So Gi Jesu Kristi Kacha di elu Gi na Muo Nso N'ebube Chineke Nna AMEN Amen, Amen, Amen

Download the sheet music

OTITO DIRI CHINEKE

OTITO DIRI CHINEKE

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
2 pages
2 Downloads
Gloria Vernacular Masses
0 0

More lyrics you may want