Full Lyrics
CHORUS
Otito dịrị Chineke n'elu kacha elu
N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ ndị nwere obi ọma.
VERSE 1
Anyị ajaa Gị mma, anyị agọzie Gị
Anyị esekpuoro Gị, anyị etoo Gị
Anyị ekelee Gị n'ihi nnukwu ebube Gị
O Seburuụwa Chukwu e, Eze nke eluigwe.
VERSE 2
Chukwu Nna ji ike niile, Dinwenu
Jesu Kristi sọ otu Nwa Chineke mụrụ
Nwa nke Nna
Gị Onye n'ekpochapụ njọ nke ụwa, meere anyị ebere
Gị Onye n'ekpochapụ njọ nke ụwa, nara arịrịọ anyị
Gị Onye nọ n'aka nri Nna, meere anyị ebere.
VERSE 3
N'ihi na sọ Gị dị nsọ, sọ Gị bụ Dinwenu
Sọ Gị Jesu Kristi kachasị dị elu
Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna
Amen.