Dubem Chineke by Chuma Chukwuka — Lyrics

Chuma Chukwuka Igbo Entrance songs Communion Hymns Prayer Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Dubem o Chineke dubem o, n'ihi na agbabawom n'ime gị Dubem o Chineke dubem o, n'ihi na agbabawom n'ime gị Ebe m nwere Eze Jizọs m gaghị atụ egwu ọzọ Nkume mgbe ebighebi kwe ka m zoro n'ime gị [VERSE 1] Tụla egwu n'ihi na gị nọnyere m o Gị sịrị m atụla egwu, elela anya gburugburu n'ụjọ N'ihi na gị onwe gị bụ Chineke m o Ị g'agba m ume were aka nri gị kwagide m Nna ka m ghara ịda [VERSE 2] N'ime okwukwe ka Moses jiri kpọrọ ụmụ Israel laa Pharaoh dara n'ime ya, ndị agha ya gwụrụ n'ime ya Sote n'okwukwe ka Naomi jiri nweta ngọzi n'uju ya Were okwukwe leta ndị gị Nna k'anyị wee guzo sijike [VERSE 3] Ma ebili mmiri ọ naamasị ike n'ụwa, Chineke m mụ anya Ewezugara ugwu n'ọnọdụ ya, Chineke m mụ anya Ekwensu n'awagharị mgbe nile, Chineke m mụ anya Were ike Mụọ Nsọ gị kwagide m Nna ka m ghara ịda [VERSE 4] O Chineke dubem o dube Dubem o Chineke, n'ihi na agbabawom n'ime gị Ebe m nwere Eze Jizọs m gaghị atụ egwu ọzọ Nkume mgbe ebighebi kwe ka m zoro n'ime gị

Download the sheet music

Dubem Chineke

Dubem Chineke

By Chuma Chukwuka
Solfa
Igbo
4 pages
20 Downloads
Entrance songs Communion Hymns Prayer Hymns
0 0

More lyrics you may want