Full Lyrics
[CHORUS]
Dubem o Chineke dubem o, n'ihi na agbabawom n'ime gị
Dubem o Chineke dubem o, n'ihi na agbabawom n'ime gị
Ebe m nwere Eze Jizọs m gaghị atụ egwu ọzọ
Nkume mgbe ebighebi kwe ka m zoro n'ime gị
[VERSE 1]
Tụla egwu n'ihi na gị nọnyere m o
Gị sịrị m atụla egwu, elela anya gburugburu n'ụjọ
N'ihi na gị onwe gị bụ Chineke m o
Ị g'agba m ume were aka nri gị kwagide m Nna ka m ghara ịda
[VERSE 2]
N'ime okwukwe ka Moses jiri kpọrọ ụmụ Israel laa
Pharaoh dara n'ime ya, ndị agha ya gwụrụ n'ime ya
Sote n'okwukwe ka Naomi jiri nweta ngọzi n'uju ya
Were okwukwe leta ndị gị Nna k'anyị wee guzo sijike
[VERSE 3]
Ma ebili mmiri ọ naamasị ike n'ụwa, Chineke m mụ anya
Ewezugara ugwu n'ọnọdụ ya, Chineke m mụ anya
Ekwensu n'awagharị mgbe nile, Chineke m mụ anya
Were ike Mụọ Nsọ gị kwagide m Nna ka m ghara ịda
[VERSE 4]
O Chineke dubem o dube
Dubem o Chineke, n'ihi na agbabawom n'ime gị
Ebe m nwere Eze Jizọs m gaghị atụ egwu ọzọ
Nkume mgbe ebighebi kwe ka m zoro n'ime gị