Full Lyrics
REFRAIN
Jesu Kristi achịcha naenye ndụ
Jesu Kristi achịcha naenye ndụ
Nye anyị ịnata Gị n'uju
Nri ụbọchị n'ekpughere anyị onwe Gị
Achịcha nke ndụ ebighị ebi, ebighị ebi
K'achịcha nke ndụ ebighị ebi, k'achịcha naenye ndụ ebighị ebi
VERSE 1
I nyejuru ndị agụụ naagụ afọ,
Ogbe achịcha ise n'azụ abụọ ka I jiri zụọ afọ,
I meri puku mmadụ ise
Nna ndị ogbenye
Kristi
VERSE 2
Ọ bụghị chọọ nanị ndụ ee ndụ dị n'achịcha
Achịcha naenye ndụ
Ọ bụghị chọọ nanị ndụ dị n'achịcha
Kama ọ bụ ịnata achịcha nke ndụ
Onye k'anyị g'eso? Onye onye nwe anyị?
Ozi nke ndụ ebighị ebi
VERSE 3
Mgbe I hụrụ igwe mmadụ ahụ
Igwe mmadụ ike gwụrụ, agụụ naagụ
I gwara ndị n'eso ụzọ Gị sị ha ka ha nye ha ihe ka ha rie,
nye ha ihe ka ha rie
VERSE 4
Onye nwe anyị Jesu Kristi,
Achịcha nke ndụ ebighị ebi mee ka anyị let'ụmụnna anyị
Achịcha nke ndụ ebighị ebi
Achịcha nke ndụ ebighị ebi mee ka anyị nye ha ihe ka ha rie
Achịcha nke ndụ ebighị ebi ebighị ebi
dịka I si akụzi anyị
Eucharistia