CHIDOZIE by Fr. Bart C. Ezeokafor — Lyrics

Fr. Bart C. Ezeokafor Igbo Communion Hymns Lenten Hymns Prayer Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Dozie, dozie chi dozie, Jeeso Chukwu mo! Chukwu nọ n'oriri Nsọ. Ka ahụ n'ọbara gị n'anata, Gbanwoo mo, saa chaa m kam dị ọcha. Ka ahụ n'ọbara gị n'anata, Doo m nsọ, Onyen dozi. VERSE 1 Ike agwụgo mo, Ike agwụgo mo, mejozi gị Jeeso mo, Biko, were amara gị jidesie nu m ike, Dozienụ m kam buru nke gị o. VERSE 2 O teela m chọbara ka mụ na gị dozie, Ma ụtọ njọ eweghị kam kwudosie. Nyere mu n'aka kam meb'uche gị, Bela tara m olili wara wara, Olili wara wara nke njọ. VERSE 3 Mgbe ebili mmiri n'ụwa n'efighari, Atụgharị mo, biko jidesie nu m ike. Kangharịda Chukwu n'edozi ihe nile, Onyen dozi. VERSE 4 Dozie nu mo, Dozie nu mo, Dozie, Dozie nu mo. SOLO E Chukwu dozie, mee m kam mara gị, Olisa dozie, ife n'esera nyị o. Dozienụ ndụ mo, nyenụ ndụ ọhụrụ, Dozie nụ ndụ mo, onye I dozi n'onwe mgbanwe. Ọwa gị dozi n'ndụ Meri Magdalin? Ọwa gị dozi n'ndụ nwanyị oneme ọbara? Zatiọsụ zutere gị, I nyeya nzọpụta, Sọọlụ zutere gị, I gbanwere aha, Nwanyị Sameria zutere gị o, I gbanwere ya ọnọdụ. Lezianụ mo Chimo, Dozie, Onyen dozi. Dozienụ mo, Onyen dozi.

Download the sheet music

CHIDOZIE

CHIDOZIE

By Fr. Bart C. Ezeokafor
Solfa
Igbo
3 pages
2 Downloads
Communion Hymns Lenten Hymns Prayer Hymns
0 0

More lyrics you may want