Full Lyrics
CHORUS
Dozie, dozie chi dozie, Jeeso Chukwu mo!
Chukwu nọ n'oriri Nsọ.
Ka ahụ n'ọbara gị n'anata,
Gbanwoo mo, saa chaa m kam dị ọcha.
Ka ahụ n'ọbara gị n'anata,
Doo m nsọ, Onyen dozi.
VERSE 1
Ike agwụgo mo,
Ike agwụgo mo, mejozi gị Jeeso mo,
Biko, were amara gị jidesie nu m ike,
Dozienụ m kam buru nke gị o.
VERSE 2
O teela m chọbara ka mụ na gị dozie,
Ma ụtọ njọ eweghị kam kwudosie.
Nyere mu n'aka kam meb'uche gị,
Bela tara m olili wara wara,
Olili wara wara nke njọ.
VERSE 3
Mgbe ebili mmiri n'ụwa n'efighari,
Atụgharị mo, biko jidesie nu m ike.
Kangharịda Chukwu n'edozi ihe nile,
Onyen dozi.
VERSE 4
Dozie nu mo, Dozie nu mo,
Dozie, Dozie nu mo.
SOLO
E Chukwu dozie, mee m kam mara gị,
Olisa dozie, ife n'esera nyị o.
Dozienụ ndụ mo, nyenụ ndụ ọhụrụ,
Dozie nụ ndụ mo, onye I dozi n'onwe mgbanwe.
Ọwa gị dozi n'ndụ Meri Magdalin?
Ọwa gị dozi n'ndụ nwanyị oneme ọbara?
Zatiọsụ zutere gị, I nyeya nzọpụta,
Sọọlụ zutere gị, I gbanwere aha,
Nwanyị Sameria zutere gị o, I gbanwere ya ọnọdụ.
Lezianụ mo Chimo, Dozie, Onyen dozi.
Dozienụ mo, Onyen dozi.