Full Lyrics
[CHORUS]
Bịa Mmụọ Nsọ, bịa n'obi anyị si n'eluigwe zidata
Ihe Gị nke dị ebebe
[VERSE 1]
Bịa Nna nkụ n'ogbenye
bịa aka n'eny'onyinye
biko Mmụọ Nsọ
mukesịa n'im'obi anyị
biko bịa Mmụọ Nsọ
[VERSE 2]
Onye ntasi obi kacha mma
bịa leta obi ndị nke Gị
Ị dị ụtọ achọrọ m
biko bịa Mmụọ Nsọ
[VERSE 3]
Ntu oyi n'oge ekpomọkụ
Ezumike ndị nọ na ndọli
ntasi obi n'oge nsogbu
biko bịa Mmụọ Nsọ
[VERSE 4]
Zite ihe Gị kacha nsọ
Ka ojupụta n'ime obi
ndị nile kwere na Gị
biko bịa Mmụọ Nsọ
[BRIDGE]
Ewepụ Gị, ewepụ Gị onweghị ihe mmadụ nkịtị
pụrụ ime mma, dighịkwa na mmadụ
[VERSE 5]
Sacha ihe rụrụ arụ
wụọ mmiri n'ebe kpọrọ nkụ
gwọọ anyị ọrịa na ọnya anyị
biko bịa Mmụọ Nsọ
[VERSE 6]
Hutu ekwe kpọrọ nkụ
Ka ihe oyi natụ gyara ọkụ
duzie ụkwụ gahieru ụzọ
biko bịa Mmụọ Nsọ
[VERSE 7]
Nye ndị kwerenụ onyinye
were onyinye asaa Gị
gọzie ndị tụkwasara Gị obi
biko bịa Mmụọ Nsọ
[VERSE 8]
Were nzọpụta
kwụọ h'ụgwọ ibi ezigbo ndụ
nye h'a nụrị ebighebi
biko bịa Mmụọ Nsọ
[AMEN]
Amen, Amen
Amen, Amen