Full Lyrics
SOPRANO SOLO
O afụfụ mmụọ
O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
TUTTI
O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
Nenegodụ ka Jesu Kristi si we bịa n'ụwa
Lụba ọlụ dị mma
Ọlụ ịhụnanya, ọlụ Chukwu
Ọ lụebube Chukwu
Ma ọ gịnị k'ụmụ ụwa ji kwụa Ya ụgwọ?
Ọnwụ n'elu obe
O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
BARITONE SOLO
Ma ọ gịnị ka Jesu melụ fa fa jia chọya ka ọ nwụa
Ka ọ nwụa ọnwụ ifele n'enu obe
Ụmụ nnem, ụmụ nnem a jụa m o
Ọ bụzịkwa Jesu Kristi melụ ka ndị ngwụrọ wụba ujọnjọlị?
Ọ bụzịkwo Jesu Kristi melụ ka ndị kpuru isi fụba ụzọ k'ugo?
Ọ bụzịkwo Jesu Kristi melụ ka ndị agụụ n'agụ liju afọ?
Ọ bụzịkwo Jesu Kristi melụ ka ndị nwụlụ anwụ we kubekwa ume ndụ ọzọ?
Ma ọ gịnị k'ụmụ ụwa ji kwụa Ya ụgwọ?
CHORUS
Ọnwụ, ọnwụ n'enu obe
Ọnwụ, ọnwụ n'enu obe
A fụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
BARITONE SOLO (CONTD)
O fa echezogo ka fa si tie Hosanna
Hosanna, Hosanna, Hosanna dịlị nwa David n'ebe kachasị enu
Hosanna, Hosanna, Hosanna dịlị eze anyị o
Ma na okweghịzu ha etighalịa
CHORUS
Ọnwụ, ọnwụ n'enu obe
Ọnwụ, ọnwụ n'enu obe
A fụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
SOPRANO SOLO
O afụfụ mmụọ
O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
N'egodụ anya ka ha si bo ya ebubo
Ụfọdụ asị n'ọ naeme arụ
N'ọ sị na ụtụ a naatụ maka Caesar na o ziro ezi n'iwu
N'ọ bụ Ya bụ eze
Bulukwanta na ihu Pilati
A sị na ya fụro ife o melu dị njọ ka ya duba ya ọdụ
Mana ha ekweghị ekwe, ha asị Ọnwụ