Full Lyrics
INTRO
Onyenweanyị, zidata Mmụọ Gị.
Mee ka ihu ụwa dị ọhụrụ.
AZỊZA
Onyenweanyị, zidata Mmụọ Gị.
Mee ka ihu ụwa dị ọhụrụ.
VERSE 1
Mkpụrụ obi m, too Onyenweanyị.
Onye nwe m na Chineke m, n'ezie Ị nweghị atụ!
Ị bara ụba n'ọrụ aka dị iche iche.
Ọ bụ Gị kere ihe jupụtara n'ụwa niile.
VERSE 2
Ọ bụrụ na Ị napụ ha ume ndụ,
ha alaa n'iyii, bịakwa laghachie ghọọ ntu.
Ọ bụrụ na Ị zidata ha Mmụọ Gị,
ha ghọọ ihe e kere eke.
Ị wee mee ka ihu ụwa dị ọhụrụ.
VERSE 3
Ka ebube nke Onyenweanyị digide ruo mgbe ebighị ebi.
Ka Onyenweanyị ṅụrịa ọṅụ n'ọrụ aka Ya.
Ka ihe m bụrụ n'abụ dị Ya mma n'obi.
Aga m aṅụrị ọṅụ n'Onyenweanyị.