OTITO DIRI CHINEKE by Ifeanyi Nwaiwu — Lyrics

Ifeanyi Nwaiwu Igbo FILM Songs Gloria Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Otito diri Chineke n'elu kasielu, udo diri ndi mmadu nd'ihe ha naaso Chukwu. Otito diri Chineke. VERSE 1 Anyi e too gi, anyi e kwuputa nma gi, anyi e sekpuoro gi, anyi e doo gi ebube. Anyi e kele gi n'ihi nnukwu ebube gi. VERSE 2 Eze eluigwe Chukwu Nna jike nile, Onyenweanyi Jesu Kristi s'otu nwa Chineke muru, Dinwenanyi bu Chukwu nwaturu nke Chineke, nwa nke Nna. VERSE 3 Onye naekpochapu njo nk'uwa, mee r'anyi ebere, mee r'anyi ebere. Onye naekpochapu njo nk'uwa, nara aririo anyi. VERSE 4 Onye no n'aka nri Nna, mee r'anyi ebere. N'ihi na so gi di nso, so gi bu Dinwenu, so gi bu Jesu Kristi kacha d'elu, nyere Muo Nso n'ebube Chukwu Nna. AMEN Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

OTITO DIRI CHINEKE

OTITO DIRI CHINEKE

By Ifeanyi Nwaiwu
Solfa
Igbo
2 pages
26 Downloads
FILM Songs Gloria
1 0

More lyrics you may want