Full Lyrics
REFRAIN
Otito diri Chineke
n'elu kasielu,
udo diri ndi mmadu
nd'ihe ha naaso Chukwu.
Otito diri Chineke.
VERSE 1
Anyi e too gi,
anyi e kwuputa nma gi,
anyi e sekpuoro gi,
anyi e doo gi ebube.
Anyi e kele gi n'ihi nnukwu ebube gi.
VERSE 2
Eze eluigwe Chukwu Nna jike nile,
Onyenweanyi Jesu Kristi s'otu nwa Chineke muru,
Dinwenanyi bu Chukwu nwaturu nke Chineke,
nwa nke Nna.
VERSE 3
Onye naekpochapu njo nk'uwa,
mee r'anyi ebere, mee r'anyi ebere.
Onye naekpochapu njo nk'uwa,
nara aririo anyi.
VERSE 4
Onye no n'aka nri Nna,
mee r'anyi ebere.
N'ihi na so gi di nso,
so gi bu Dinwenu,
so gi bu Jesu Kristi kacha d'elu,
nyere Muo Nso n'ebube Chukwu Nna.
AMEN
Amen, Amen, Amen.