OME IHE by S.O. Emma Agu — Lyrics

S.O. Emma Agu Igbo Hymns Offertory Hymns Celebrations Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Yahweh emeela ihe juru m anya O mere ya oge m naatụghị anya ya Mgbogho njuru doro n'ime m dum O mere m ọñụ ihe juru m afọ N'ime m dum m'omere m ọñụ ihe juru m anya Yahweh emeela ih'o jiri buru Chukwu Ọ naeme ih'o mekwala k'osieme O tinye b'ọchị n'ọnụ m taa O tinye l'ọnụ n'obi m o Ihe m rịọrọ ya k'Ọ meere m tinye jara m anya Ihe juru m afọ Meere m mma eh, otito ya g'adị m n'ọnụ Oge niile n'ebe niile Ome ihe ribe otito m n'ome ebe niile Ih'o jiri buru Chineke Ribe si n'alaala obi m pụta [VERSE 1] Imeela, Imeela Chukwu n'ime m dum o Imeela, Imeela Yahweh Imeela ị dị mma N'asọ m ụtọ isogbuo m ị dịrị m mma Obi m naañụrị n'ịdị mma gị Chukwu Ị dị mma, ị dị mma, ị dị mma, ị dị m'ụtọ Ị dị mma Chukwu Kwe ka m tuonu gị ọka n'ịgba abụba Chukwu I dejindum owanku sirike na ndụ m o [VERSE 2] Kedu ihe m g'emere Chineke Ga m esi aña kele gị Chineke? Ọ bụ akụ n'ụba k'ọ bụ ego Ọ bụ ụlọ k'ọ bụ ụgbọ njem n'ezie Amam n'ih'ụtọ nk'ụwa adịghị amasị gị Kedu nnọọ kedu nnọọ ihe m g'emere Chineke Ị n'eri ih'oriri? Ị n'añụ ihe ọñụñụ? Ị n'eyi ukwu uwe, k'ị n'ekekike? Amam n'ih'ụtọ nk'ụwa adịghị amasị gị Naanị otito k'ị n'eri Otito Ndị nsọ n'ebunye gị Ndị mmụọ ozi n'ebunye gị Nzukọ n'ebunye gị Ndị echichi n'ebunye gị Ndị ụka n'ebunye gị Ụmụ mmadụ n'ebunye gị Ezi n'ụlọ n'ebunye gị Mụ onwe m n'ebunye gị Otito n'ị dị mma

Download the sheet music

OME IHE

OME IHE

By S.O. Emma Agu
Solfa
Igbo
4 pages
5 Downloads
Hymns Offertory Hymns Celebrations
0 0

More lyrics you may want