Full Lyrics
[REFRAIN]
Yahweh emeela ihe juru m anya
O mere ya oge m naatụghị anya ya
Mgbogho njuru doro n'ime m dum
O mere m ọñụ ihe juru m afọ
N'ime m dum m'omere m ọñụ ihe juru m anya
Yahweh emeela ih'o jiri buru Chukwu
Ọ naeme ih'o mekwala k'osieme
O tinye b'ọchị n'ọnụ m taa
O tinye l'ọnụ n'obi m o
Ihe m rịọrọ ya k'Ọ meere m tinye jara m anya
Ihe juru m afọ
Meere m mma eh, otito ya g'adị m n'ọnụ
Oge niile n'ebe niile
Ome ihe ribe otito m n'ome ebe niile
Ih'o jiri buru Chineke
Ribe si n'alaala obi m pụta
[VERSE 1]
Imeela, Imeela Chukwu n'ime m dum o
Imeela, Imeela Yahweh
Imeela ị dị mma
N'asọ m ụtọ isogbuo m ị dịrị m mma
Obi m naañụrị n'ịdị mma gị Chukwu
Ị dị mma, ị dị mma, ị dị mma, ị dị m'ụtọ
Ị dị mma Chukwu
Kwe ka m tuonu gị ọka n'ịgba abụba Chukwu
I dejindum owanku sirike na ndụ m o
[VERSE 2]
Kedu ihe m g'emere Chineke
Ga m esi aña kele gị Chineke?
Ọ bụ akụ n'ụba k'ọ bụ ego
Ọ bụ ụlọ k'ọ bụ ụgbọ njem n'ezie
Amam n'ih'ụtọ nk'ụwa adịghị amasị gị
Kedu nnọọ kedu nnọọ ihe m g'emere Chineke
Ị n'eri ih'oriri? Ị n'añụ ihe ọñụñụ?
Ị n'eyi ukwu uwe, k'ị n'ekekike?
Amam n'ih'ụtọ nk'ụwa adịghị amasị gị
Naanị otito k'ị n'eri
Otito Ndị nsọ n'ebunye gị
Ndị mmụọ ozi n'ebunye gị
Nzukọ n'ebunye gị
Ndị echichi n'ebunye gị
Ndị ụka n'ebunye gị
Ụmụ mmadụ n'ebunye gị
Ezi n'ụlọ n'ebunye gị
Mụ onwe m n'ebunye gị
Otito n'ị dị mma