Full Lyrics
[CHORUS]
Yahweh emeela ihe juru m anya
O mere ya oge m naatụghị anya ya
Omeela ya
Mgbogbajuru doro n'ime m dum, O mere m ọnụ
Ihe juru m anya
Ihe juru m ọnụ
Yahweh emeela ihe o jiri bụrụ Chukwu
Ọ naeme ihe o jiri bụrụ Chukwu
O tinyela ọchị n'ọnụ m taa
O tinyela ọnụ n'ihe m rịọrọ ya
K'o mere m tinye jara
Metala m mma eh
Otito ya gaadị m n'ọnụ
Oge niile n'ebe niile
Ome ihe ribe otito m n'ome n'ebe niile
Ihe o jiri bụrụ Chineke
Si n'alaala obi m pụta
[VERSE 1]
I meela, I meela
I meela, I meela Yahweh
I meela, I meela Yahweh
Ị dị mma, ị dị mma
Ị dị mma, ị dị mma Yahweh
Ee! Ị naasọ m ụsọ
Ị naasọ m ụsọ isogbuo
Dịrị m mma obi m naañụrị n'ịdị mma gị Chukwu
Ị dị mma, ị dị mma, ị dị mma, ị dị mma, ị dị m'ụsọ
Ị dị mma Chukwu
Kwe ka m tụọ nụ gị, ok'anụ gbara abụba Chukwu, ị dejin dum
Owanku siri ike na ndụ m, ị dejin dum
[VERSE 2]
Kedu ihe m gaemere Chineke
Ga m esi aña kelee gị Chineke?
Ọ bụ akụ n'ụba k'ọ bụ ego
Ọ bụ ụlọ k'ọ bụ ụgbọ njem n'ezie
Amam n'ihe ụsọ nke ụwa a adịghị amasị gị
Kedu nnọọ, kedu nnọọ ihe m gaemere Chineke
Ị naeri ihe oriri? Ị naañụ ihe ọñụñụ? Ị naeyi ukwu uwe, k'ị naekekike?
Amam n'ihe ụsọ nke ụwa a adịghị amasị gị, ihe m gaemere gị
Nani otito k'ị naeri Yahweh
Ndi nso naebunye gị otito
Ndi mmụọ ozi naebunye gị otito
Nzụkọ naebunye gị otito
Ndi ụka naebunye gị otito
Ụmụ mmadụ naebunye gị otito
Ezi n'ụlọ naebunye gị otito
Mụ onwe m naebunye gị otito n'ị dị mma