Full Lyrics
[CHORUS]
Ọbịnasọm uo ai yei ye
Ọbịnasọm uo mgbe m nụrụ k'aha n'asị e
K'anyị jee nụ n'ụlọ nsọ
K'anyị jee nụ n'obi eze
Onye ihe nile dị n'aka Ya
Onye ji aka Ya du n'ọnwa Ya
Onye n'enwerọ mgbanwe nke n'ọjị enwe njedebe
Chineke eze ukwu
Nwannem wer'añụrị bata
K'anyị kelee Chineke Ony'ọma
[BASS SOLO]
Oseburụwa m re kete Onyenwemmadụ a bịaram ba Gị
Anyị sị k'anyị bịakporo Gị isiala
Ihe ị n'emer'anyị ebuka
Ogologo ndụ Gị n'enye anyị
Ahụ ike anyị dị Gị n'aka
Jị n'ede anyị n'akọbụ ọrụ aka Gị
Ụmụ n'ụba nyị bụ ọrụ aka Gị
Ya k'anyị ji bịan'iru Gị ịkpọrọ Gị isiala
[SOPRANO]
Ọ ma lee ihe ọma nile dị n'ụwa ebub'ebube
Aịne ha ncha bụ ọrụ aka Ya
Ọnwa na kpakpando nwannem ọkwa Chukwu kere ha
Anụ enu na an'ọmmịrị añụala tobe Chukwu
Ụwa na ihe nile dị n'ime ya bụ nke Gị
Ezi Chukwu gịm'elekọta ya
Ony'Eze Chineke abịaram be Gị
Ọmalịcha Ọmalịcha
[CHORUS]
Kwu je rịọ Ya mgbaghara
K'anyị je gbusa ikpere ala rịọwa Ya mgbaghara
K'anyị je n'iru Chineke na rịọkwa Ya ngọzi
Na Misa dị asọ Chukwu na akpudebe anyị nsọ
Ọ ma edokwa anyị nsọ
Ọ n'enyekwa anyị ngọzi
Chineke gbadatụ
K'anyị na Gị nọnịa ai yei ye ai yei ye
Chine k'ahụ k'anyị n'anya
Chine k'ahụ k'anyị n'anya
[BASS SOLO]
Nwannem beko kam jụkene gị
Ngọzi a nịne Ọ n'enukwa gị atọn nsọ
Chine k'ahụka mu n'anya
Nwannem Chine k'ahụka mu n'anya
[CHORUS]
Kedu nke bụ na Chukwu zitere Nwa Ya
K'Ọ zọpụt'anyị n'ọnwụ jọ
Sị n'onye riri Ya g'enwe ndụ
Onye hụrụgo dị mma
Onye riri ọjị kpaa yọ nkụ tọh
Ụmụ Chineke butenụ ngwa egwu
K'anyị tiere Y'egwu
Ngwanụ k'anyị jee tiere Y'egwu dị mma
Ngwanụ k'anyị jee tiere Y'egwu dị mma
Ngwanụ k'anyị jee tiere Y'egwu dị mma kọm kọm kọm
Bute nụ ngwa egwu k'anyị kpọrọ Chineke tiere Y'egwu dị mma
Egwu ọma egwu ọma
Tiri tiri tum tiri tum tum tum tum tutu tum tum
[SOPRANO SOLO]
Anyị nwere egwu dị mma
Egwu anyị ji eto Chukwu
Chukwu Onye nyer'anyị nzọpụta
Chukwu n'egboro mu mkpa maị
Onye nwuwa n'uju ya
Onye bere ony'ọma K'Ọ bụ
Chukwu ebuka Chukwu ebuka
K'anyị je nụ na Misa dị asọ je zute Ya
[CHORUS]
Egwu ọma egwu ọma
Tiri tiri tiri tiri tum tum tum tum tum tum tum tum