K'anyi Jee N'Obi Eze by Linus Okwu — Lyrics

Linus Okwu Igbo Entrance songs Folk songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Ọbịnasọm uo ai yei ye Ọbịnasọm uo mgbe m nụrụ k'aha n'asị e K'anyị jee nụ n'ụlọ nsọ K'anyị jee nụ n'obi eze Onye ihe nile dị n'aka Ya Onye ji aka Ya du n'ọnwa Ya Onye n'enwerọ mgbanwe nke n'ọjị enwe njedebe Chineke eze ukwu Nwannem wer'añụrị bata K'anyị kelee Chineke Ony'ọma [BASS SOLO] Oseburụwa m re kete Onyenwemmadụ a bịaram ba Gị Anyị sị k'anyị bịakporo Gị isiala Ihe ị n'emer'anyị ebuka Ogologo ndụ Gị n'enye anyị Ahụ ike anyị dị Gị n'aka Jị n'ede anyị n'akọbụ ọrụ aka Gị Ụmụ n'ụba nyị bụ ọrụ aka Gị Ya k'anyị ji bịan'iru Gị ịkpọrọ Gị isiala [SOPRANO] Ọ ma lee ihe ọma nile dị n'ụwa ebub'ebube Aịne ha ncha bụ ọrụ aka Ya Ọnwa na kpakpando nwannem ọkwa Chukwu kere ha Anụ enu na an'ọmmịrị añụala tobe Chukwu Ụwa na ihe nile dị n'ime ya bụ nke Gị Ezi Chukwu gịm'elekọta ya Ony'Eze Chineke abịaram be Gị Ọmalịcha Ọmalịcha [CHORUS] Kwu je rịọ Ya mgbaghara K'anyị je gbusa ikpere ala rịọwa Ya mgbaghara K'anyị je n'iru Chineke na rịọkwa Ya ngọzi Na Misa dị asọ Chukwu na akpudebe anyị nsọ Ọ ma edokwa anyị nsọ Ọ n'enyekwa anyị ngọzi Chineke gbadatụ K'anyị na Gị nọnịa ai yei ye ai yei ye Chine k'ahụ k'anyị n'anya Chine k'ahụ k'anyị n'anya [BASS SOLO] Nwannem beko kam jụkene gị Ngọzi a nịne Ọ n'enukwa gị atọn nsọ Chine k'ahụka mu n'anya Nwannem Chine k'ahụka mu n'anya [CHORUS] Kedu nke bụ na Chukwu zitere Nwa Ya K'Ọ zọpụt'anyị n'ọnwụ jọ Sị n'onye riri Ya g'enwe ndụ Onye hụrụgo dị mma Onye riri ọjị kpaa yọ nkụ tọh Ụmụ Chineke butenụ ngwa egwu K'anyị tiere Y'egwu Ngwanụ k'anyị jee tiere Y'egwu dị mma Ngwanụ k'anyị jee tiere Y'egwu dị mma Ngwanụ k'anyị jee tiere Y'egwu dị mma kọm kọm kọm Bute nụ ngwa egwu k'anyị kpọrọ Chineke tiere Y'egwu dị mma Egwu ọma egwu ọma Tiri tiri tum tiri tum tum tum tum tutu tum tum [SOPRANO SOLO] Anyị nwere egwu dị mma Egwu anyị ji eto Chukwu Chukwu Onye nyer'anyị nzọpụta Chukwu n'egboro mu mkpa maị Onye nwuwa n'uju ya Onye bere ony'ọma K'Ọ bụ Chukwu ebuka Chukwu ebuka K'anyị je nụ na Misa dị asọ je zute Ya [CHORUS] Egwu ọma egwu ọma Tiri tiri tiri tiri tum tum tum tum tum tum tum tum

Download the sheet music

K'anyi Jee N'Obi Eze

K'anyi Jee N'Obi Eze

By Linus Okwu
Solfa
Igbo
7 pages
64 Downloads
Entrance songs Folk songs Hymns
1 0

More lyrics you may want