Full Lyrics
REFRAIN
Heh! Obiligo! Eh! Obiligo!!
Kristi emerigo ọnwụ, Omerigo n'ọnwụ!
Olorihelorenyi, ọnwụ nanjọ eeh, Omerigo.
Obiligo! Obiligo n'ọnwụ!
K'anyị ṅụrịbanụ, butenụ egwu ọma, n'opi eke;
Ụwa nile ṅụrịba, k'anyị gbabatanụ y'egwu.
Kristi Dinwenụ nyi n'ezie omerigo.
Odogwu n'agha! Ak'anebuggha!
K'ekwensu adago mba, nmeri chime.
Ọgba ak'eji ọgụ! Chineke egosigo na ya b'Eze bu ike k'ike!
Nwa Chineke Omerigo!
Ọ bụ ya bụ Nwa Chineke Omerigo!
Odogwu eeh, Odogwu emerigo.
VERSE 1
Na Gesthamani Kristi ruru ju,
Ọkpụọgwụ, ụtarị apịara ya,
a kpọgbue ya n'obe. Omerigo.
VERSE 2
N'ụtụtụtụ, mgbe anwụ walụ, n'ụbọchị nkatọ;
Ụmụ nwaanyị gaba n'ili mana ha hụghị ya.
Ha chọrọ y'elu, chọọ ya n'ala, chọọ ya n'ugwu,
chọọ y'ebe nile mana ha hụghị ya.
Ha n'achọ ya makana ha hụghị ya.
VERSE 3
Otu Muọzi kwuru n'ụzọ wee sị ha,
Ọ bụrụ g'unyzọ gaba na Galilee.
Gabanụ gagw'ụmụazụ ya n'obiligo!
VERSE 4
Akanri Chukwu emeriela.
Akanri y'eweliela m'elu.
Ọnwụ O lee ike gị? Omerigo!
Onye gburegbu, lie ya n'ala, wer'okwute kpuchite ya;
O lee nmeri gị? Omerigo.