Nyenu Messiah by Sam Ojukwu — Lyrics

Sam Ojukwu Igbo Psalms Anthems Solfa notation

Full Lyrics

[INTRO] Nyenu Messiah, Messiah, Nyenu Messiah, Messiah. Nyenu Messiah, ụmụ Chineke, Nyenu Messiah, Messiah, Nyenu Messiah, Messiah, Nyenu Messiah nsọpụrụ na ike. [REFRAIN] Nyenu Messiah, ụmụ Chineke, Nyenu Messiah, Messiah. Nyenu Messiah nsọpụrụ, Nyenu Ya doo, nyenu Ya doo, Nyenu Messiah nsọpụrụ, Nyenu Messiah nsọpụrụ na ike. Nyenu Messiah, Messiah, Kpọọ nụ isi ala nye Messiah n'ịja mma nke ịdị nsọ. [VERSE 3] Olu Messiah dị n'elu mmiri, Chineke nke ebube naagba egbe eluigwe, Messiah nọ n'elu ọtụtụ mmiri. [VERSE 4] Olu Messiah naada n'ike n'ike, N'ịma mma, ọ n'ịma mma. Olu Messiah naetiwa osisi Cedar, Messiah wee tiwasịa, tiwasịa, tiwasịa osisi Cedar nke Lebanon. [VERSE 6] Ọ naeme ka ha naawụlị elu, Dịka nwa ehi bụ Lebanon na Sirion dịka nwa ehi. [VERSE 7] Olu Messiah naawapụta ire ọkụ. [VERSE 8] Olu Messiah naeme k'ọzara mee mkpọtụ, Messiah naeme k'ọzara Kedesh mee mkpọtụ. [VERSE 9] Olu Messiah naeme ka ime naeme nne ele, Ọ naekpọchapụkwa akwụkwọ osisi oke ọhịa, Ihe niile naasị EBUBE. [VERSE 1011] Messiah nọdụrụ n'oche eze, N'ijummiri ahụ Messiah wee nọdụ dịka eze. Messiah gaenye ndị Ya ike, Messiah gaeji udo gọzie ndị Ya. EBUBE, ihe niile naasị EBUBE!

Download the sheet music

Nyenu Messiah

Nyenu Messiah

By Sam Ojukwu
Solfa
Igbo
5 pages
1 Downloads
Psalms Anthems
0 0

More lyrics you may want