Full Lyrics
CHORUS
Anyị abịa inye gị ekele,
nara onyinye anyị n'obi ọcha.
Tuchilammehie nile anyị mere,
nara ya biko Chineke ma gọzie ya n'obi ebere.
Nara ya biko ma gọzie ya n'obi ebere.
VERSE 1
Ezi Chineke nar'onyinye ụmụ gị n'enye gị,
anyị n'arịọ gị ka ị nara ya dị k'onyinye
Abel nwa odibo gị,
na aja nk'ụkọchukwu gị Melkisedek.
VERSE 2
Cheta na mmiri ozuzo bụ onyinye Chineke nyer'anyị n'efu,
Ọnwa na anyanwụ, ha ncha bụ ọrụ aka Chukwu,
Ikuku n'enye anyị ndụ bụ onyinye Chukwu,
gịnị ga agbọchi sị inye y'ekele dị mma.
VERSE 3
Oge erugo ụmụ Chineke,
ngwanụ, kulitenu,
kulitenu ka nyi ga nye ya ekele.
Mak' ihe ọma dị iche Chineke m'er'anyị,
ngwanụ, kulitenu ka nyi ga nye ya ekele.
Lee o weghị anya ka ị hụ ọrụ ebube Chineke ruru gị.
ngwanụ, kulitenu ka nyi ga nye ya ekele.
Mgbe ị naanọrịa ọ bụ ya gwọrọ gị, nye gị ahụike,
ngwanụ, kulitenu ka nyi ga nye ya ekele.
Mgbe ị naaganjem ọ bụ ya n'edu gị,
ngwanụ, kulitenu ka nyi ga nye ya ekele.
Oge erugo ụmụ Chineke,
ngwanụ, kulitenu ka nyi ga nye ya ekele.