Full Lyrics
[REFRAIN]
Lee nnukwu ụkọchukwu,
Lee nnukwu ụkọchukwu,
Lee nnukwu ụkọchukw'onye mer'ihe nasọ Chineke mgbe ọ naachị,
Onye mer'ihe nasọ Chineke,
Onye mer'ihe nasọ Chineke
mgbe ọ naachị.
[VERSE 1]
Ahụghị onye dịka ya n'ideb'iwu nk'Onye kach'elu,
Ahụghị onye dịka ya n'ideb'iwu nk'Onye kach'elu.
[VERSE 2]
Onyenweanyị wer'ihi ya ṅụa iyi mee k'ugwu ya di ebighiebi n'etiti ndị nke Ya.
[VERSE 3]
Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ kịta n'ụwa ebighiebi.