Full Lyrics
[CHUKWU ROTALU ABRAHAMREFRAIN]
Chukwu hotara Abraham,
Maka okwukwe nke ya.
O nyere igbu nwa ya,
Maka ihi nke Chukwu.
[CHUKWU ROTALU ABRAHAMVERSE 1]
Aja Missa dị nsọ pụlụ, dị nnukwu omimi.
O nyere mmadụ nzọpụta.
[CHUKWU ROTALU ABRAHAMVERSE 2]
Adam na Eve, na Paradise,
Jụrụ ịchụ Aja.
Chukwu we ju idebe ha
N'ọkwa nke ụmụ Ya.
[CHUKWU ROTALU ABRAHAMVERSE 3]
Jesu Kristi, Adam ọzọ,
Chụlụ aja na elu obe,
Aja nke gbapụtara anyị,
Aja dị ebebe.
[IHE M NWERE KAM GA ENYE DINWENUREFRAIN]
Ihe m nwere ka m ga enye Dinwenu,
Onyinye nke dị mma n'asọ Chukwu.
Were ihe ọma kelee Chukwu,
Kele ya, Chineke nwe ihe ọma dum.
[IHE M NWERE KAM GA ENYE DINWENUVERSE 1]
Nyenụ Chukwu onyinye ụnụ, ihe ọma.
[IHE M NWERE KAM GA ENYE DINWENUVERSE 2]
Ọ bụ Chukwu kere ụnụ, Ezi Chukwu.
[IHE M NWERE KAM GA ENYE DINWENUVERSE 3]
Nye onyinye n'ụlọ nsọ, Ihe ọma.
[IHE M NWERE KAM GA ENYE DINWENUVERSE 4]
Nye onyinye Chineke, Ihe ọma.
[IHE M NWERE KAM GA ENYE DINWENUVERSE 5]
Nyenụ Chukwu obi ụnụ, Ihe ọma.
[IHE M NWERE KAM GA ENYE DINWENUVERSE 6]
Chukwu nara onyinye ụnụ, Ezi Chukwu.
[IHE M NWERE KAM GA ENYE DINWENUVERSE 7]
Chukwu gazia obodo anyị, Ezi Chukwu.
[IHE M NWERE KAM GA ENYE DINWENUVERSE 8]
Udo g'adịrị ụnụ nile, Amen Amen.