Full Lyrics
VERSE 1
Olu nke Chukwu n'ada n'im' obi si
Nwam, ihe ndia di njo,
Nwam, ihe ndia di njo,
Ejesola ha, nwam.
M'olu nk'ekwensu n'ada n'ime nti si
Nwam, ihe ndia di mma,
Nwam ekwela ha laa, ezi nwam.
VERSE 2
Mgb'ayi n'ewih' onye ozo Chukwu n'asi
Nwam, ihe nka di njo,
Nwam, ihe nka di njo,
Emekwala ya, nwam.
M'onye n'arafughi b'ekwensu n'asi
Nwam, ihe nka di mma,
Nwam o g'emeba gi, ezi nwam.
CHORUS
Ihe ndia di njo Chukwu n'asi,
Ihe ndia di mma bu olu nk'ekwensu.
M'o naakanyi to inu nk'ekwensu
N'isoro olu ya n'ekwu, n'asi
Ihe ndia di mma, di mma, di mma, di mma, di mma, di mma.
VERSE 3
Mg'ayi n'ejekwuru njo Chukwu n'asi:
Nwam, ihe nka di njo,
Nwam, ihe nka di njo,
Ejesola ya, nwam.
M'onyio nke madu bu ekwensu n'asi
Nwam ihe nka di mma,
Nwam, disike mee ya, ezi nwam.
VERSE 4
Mg'ayi n'ekwuto atakwu, Chukwu n'asi:
Nwam, ihe ndia di njo
Ekwukwala nggo, nwam.
M'onye n'emebi uwa bu ekwensu n'asi:
Nwam, ihe ndia di mma,
Nwam, ha n'ewet' onu, ezi nwam.
VERSE 5
Nime kworo n'ikp'asi, Chukwu n'asi,
Nwam, ihe ndia di njo,
Nwam, ihe ndia di njo,
N'ahukwa n'anya, nwam.
M'onye nduhie nk'uwa bu ekwensu n'asi,
Nwam, ihe nka di mma,
Nwam, anya la r'anya, ezi nwam.