Full Lyrics
Zuzugbe, zuzugbe
Eze ziri mo, ejim ozi
Ozi anuri kwube
Or'obodo amarizu geem nti n'olu
Ndi Eze ieme onu geem nti n'oluo
Obodo udo n'anchi geem nti n'oluo
Eze ziri mo, ozi ngonli
O sir' Okoro riagbaghe puta nu n'ama
Ndi nne na ndi nna puta nu n'ama
Dinta, dimgba, dinkwu, bianu n'ama
Umu nta kir'amarizu putanu n'ama
Ine n'ugbo gi putanu n'ama
Ine n'ime ahia gi putanu n'ama
Ihe obula in'eme gi hapu ya biawa
Eze siri onye n'abia ya taa akwu biawa
Onye n'abia ya yit'akwa mme mme ya
Eze ziri mo ya bu ozi anuri
Eze ziri mo ya bu ozi ngoli
Ony'ozi daalu anyi anugo ozi nile izir'anyi
O g'adiri gi mma mana k'anyi juo
Makana ony'ajuju anaghi efu uzo n'ama
Ezi okwu ony'ozi emume a Eze kpor'anyi bia r'anyi na mberede
Eh! ezigbo ajuju ony'ozi zanu anyi
Unu amara Bishop? I mara Fada?
Unu amara Koti na ndi st Mulumba nile?
Ibu ha n'eze kper'oriri ha n'eme emume ncheta otu onye nso
Kwa aro nile
Onye n'abia ya taa akwu biawa
Onye n'abia ya yit'akwa mme mme ya
Onye n'abia o jir'obi ocha bia
O jir'obi sarisari
Eze ziri mo dikam si wee kwu na mbu
Ewu nwuru n'obaji obughi aguu gburu ya
Si kele onye chiri nti elu anughi ala g'anu
Anka ana ana dike bu ugo k'an'enyi ya
Ony'ozi kowa r'anyi k'anyi ghota kwuo nu...
Ony'ozi tupenye anyi azu biko
Ha kpue ewu, ha kpue efi
Ha jikwo kuko pirakwa nkwu na egwu wee bia
Onye n'kata nukata afo ya azaa
Bia rie abughi bia ruo
A gam eje, i sokwa eje?
Nne m g'eje, nna m g'eje
Dinta, dimgba, dinkwu bianu k'anyi jee
Ozor kowa l'ochaa o
Chere loolo ya ndi ichie g'abta
Obodo g'ezuru Eze siri onye n'abia ya jebe iye ngala
Onye n'abia ya zob'ije ngoli
Onye n'aga ya meebachi bia wa
I kwadocha l jir'ije aueleo
I kwadocha sir'obi sarisari
Nwata n'aga ya jir'ije ngala
Okenye gaba ya zob'ije ngala
Agbogho gaba ya jebe k'adaeze o
Okoro kwadochaa y'atun'egwu bia wa
Eze kpor'anyi o bianu k'anyi jee
Ony'ozi daalu anyi anugo ozi nile izir'anyi o g'adiri gi mma
Oriri biam biam
Saint Mulumba biam biam n'onu
Bia rie abughi bia puo
Onye nwere nti nur'olu mo
K'anyi jee nu jee zaa Eze anyi n'oku o n'akpo anyi
K'anyi agbacha boolu arachaa oloma
Onye nwere nti n'ur'olu mo gaba n'iru nambe nile
Nk'in'agba ike agwukwala gi biko
Aka aja aja n'obut'onu mmanu
Onye nwere nti n'ur'olu mo jisi enu ike adala mba
K'Eze n'agwa anyi kanyi je zua Eze anyi n'oku o n'akpo anyi
Onye nwere nti n'ur'olu mo k'anyi jir'ofubje kwur'ibe ya
Ji de nwa nne gi k'a k'anyi gba n'anyi n'eze n'akpo anyi
O jee n'ukwu osisi o koba mmadu o chi obubo l'esochi ya
Biana ri taa obughighi afo ihe echi gaaka mma