GORIBENU - Choir Script PDF Thumbnail
Preview
0 0
0 downloads
Added Jul 31, 2026
Uploaded By: Choir PDFs
Format: Staff & Solfa
Language: Igbo
Pages: 4 pages

GORIBENU by IZU MARCEL ONYEOCHA — Lyrics

Ike nile nke eligwe ṅụrịwanụ! Igwe ndị mmụọ ma nile kweben'ukwe! Goriwenụ, ihe okike nile nụrụ bọrọ ukpu eze Chineke! Jesu Kristi Eze anyị ebilitego! Ghabenụ opi nke nzọpụta. Ụwa, ṅụrịa n'eki ihe amụke amụke, were ihe nke unye Eze gị chawapụta! Kristi emerigo! Ebube ejupụtala n'ime gị Ọchịchịrị enwekwaghị ọnọdụ n'ụwa! Nne dị asọ bụ Ụka ṅụrịwa, Nụ ego li n'otito. Nyabụ Onye Nzọpụta nụ bilitere n'ọnwụ n'achakwa sị gị! Ka'ebe a nile jupụta na ụzụ aṅụrị, na aza ghachi nnukwu abụ ndị nke Chineke nile! Ndị enyịm ọma, mụ na ha guzo n'ihe a dị asọ soronụ m n'ịrịọ Chineke ebere ka O nye nwaodibo ya na ekwesịghị ekwesị grasia iji kwenkwe'otito Paska Ya Onyenwe'anyị nọnyere'ụnụ. Nọnyere kwa gị. Welite nụ'obi elu. Anyị'ewelite ha n'ebe Dinwenụ nọ. K'anyị nyenụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele O kwesịrị ka ihe ziri ezi. O kwesịrị'nnọ k'anyị we're'obi'anyị nile mkpụrụ'obi'anyị nile na ulu anyị nile natọ Chineke n'anaghị ahụ'anya, Nna ji ike nile, na so otu Nwa ya Di nwenụ'anyị Jesu Kristi. Maka na Kristi ejirila ọbara ya gba'aanyị kwụchitere anyị ụgwọ njọ Adam n'aka Nna dị ọwatọwa. Ihe a bụ emume ngafega anyị, mgbe e ji egbu Kristi ezigbo Nwatụrụ nke ọbara ya naedo ụlọ ndị nile kwerenụ asọ. Ihe a bụ'uchichi nụ mgbe ị zọpụtasịrị Nna'anyị ha isi ri n'ọbụnbụ tọhapụ ụmụ Isrel duru ha, ụkwụ kọrọ kọrọ ha kufeere osimiri. Ihe a bụ'uchichi nụ mgbe ị de ọkụ kpọsara ọchịchịrị nke njọ. Ihe a bụ anyasị nụ, mgbe ọma a gbachịpụ njọ ndị ụmụ Kristi nụ n'ebe nile, zọpụta ha na mmetọ nile, kpọbatakwa ha n'ọkwa grasia
Read full lyrics

About GORIBENU

"Goribenu" is an Igbo setting of the Exultet, the great Easter Proclamation sung during the Easter Vigil. The title itself calls the heavens and the earth to rejoice, setting the tone for the most triumphant moment in the liturgical year. When the church is in darkness and the Paschal candle is lit, this chant rings out to announce that Christ has conquered death and risen in glory.

Izu Marcel Onyeocha’s arrangement captures the solemnity and the soaring joy of this ancient text. The melody carries the cantor through the long, narrative prayer of salvation history—from the fall of Adam to the deliverance of the Israelites, culminating in the resurrection of Jesus. It includes the familiar dialogue where the priest or cantor calls the congregation to lift up their hearts ("Welite nụ'obi elu"), drawing everyone into the great prayer of thanksgiving.

For a cantor or choir, preparing the Exultet is a profound responsibility. This setting provides a majestic, flowing structure that supports the weight of the words. As the chant progresses toward its final "Amen," it fills the sanctuary with a sense of awe, reminding the faithful of the light of Christ that dispels all darkness.