Full Lyrics
[CHORUS]
Ekwem n'ofu Chukwu
Ekwem n'ofu Chukwu
Ekwem n'ofu Chukwu Nna nwe ike niile
Onye kee eluigwe na anị
[VERSE 1]
Ya na Jesu Kristi sọfụ Nwa Chukwu
Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu pụta
Ekwem n'ofu Chukwu
[VERSE 2]
Ya na Nna bụ ofu n'ihe waji bụ Chukwu
Onye ji maka ifi nzọpụta anyị
Si n'eluigwe gbadata
Ekwem n'ofu Chukwu
[VERSE 3]
Onye bu n'ahụ n'aka Virgo Maria
Si ta na Mmụọ Nsọ, wa mụọ ya
Wa kpọgbuo e n'obe maka ifi anyị
N'okpuru ọchịchị Pontius Pilate
Ọ kụnite n'ụbọsị nke atọ
Ọ ligo n'eluigwe n'ọdụ n'aka nni Nna
Ọ gaabịa ọzọ i kpe ndị dị ndụ na ndị nwụnwụ ikpe
Ekwem n'ofu Chukwu
[KYRIE]
Onye nwe anyị
Onye nwe anyị biko Nna mee ebere
Kristi
Kristi Nna mee ebere
Onye nwe anyị
Onye nwe anyị biko Nna mee ebere
[VERSE 4]
Ekwem na Mmụọ Nsọ Onye nwe nị n'enye ndụ
Ekwem n'ofu Chukwu
Onye si n'aka Nna na Nwa were bịa
Onye si n'aka ndị amụma kwue okwu
Ekwem n'ofu nzukọ Nsọ Katọlik
Ekwem n'ofu Baptism nke mgbaghara njọ
Ekwem na mbinite ndị nwụrụ ya na ndụ ebebe