Full Lyrics
REFRAIN
Ekelere m Chi n'eme mma,
N'ihi ihe ọma o meere m,
Ihe mmadụ naekweghị ka m buru,
Ka m mechara wee buru.
O tinyere m n'ebe dị elu ma hichaa anya mmiri m o,
Ụmụnne m na Kraịst, soro m kelee nụ ya.
VERSE 1
Maka ihe mma ị naemeere m o,
Ya mere m ji nọrọ n'ihu gị naajuwe sị,
Buru na buru sị abụ otito,
Makana ị bụ onye nyemaka, n'ị bụ onye nzọpụta m o.
VERSE 2
Ị mara ọnụ ha ji kọọ m o,
Ọ mechara bụrụ ọnụ ha ji asọzi m o,
Maka Chi chetara.
Akụkọ m agbanwela o,
Makana Ifeanyichukwu bụ eziokwu,
Ọnweghị ihe ị naenweghị ike, Chukwu m o.
VERSE 3
Ekele dịrị Onyebube bụ ebe Chukwu Nna,
Ekele dịrị Nwa na Nwa ya, maka o nwụrụ ọnwụ n'obe.
Ekele dịrị Mmụọ Nsọ onye naedu anyị,
Onye siri n'ọnwụ bilie, ihe ebube n'onwe ya,
Kedu maka Mmụọ Nsọ onye je n'ihu na.