Full Lyrics
[CHORUS]
Muọ nsọ muọ nsọ, oh Chukwu Muọ nsọ
Muọ nsọ muọ nsọ, oh Chukwu Muọ nsọ
Oh Chukwu Muọ nsọ
Weta ìhè Gị, weta ìhè Gị
N'ime obi anyị
Munye ọkụ nke ịhụnanya Gị n'obi ndị kwere na Gị
Oh Chukwu Muọ nsọ, Nna dị nsọ
[VERSE 1]
Ị napụ ha ume ndụ ha gaala n'iyi
Ma Ị zida mmụọ Gị ha bụrụ ihe e kere eke
Ụwa agaghị ama Chukwu m'ọ bụ iru n'iru neghin sọ
Oh Muọ nsọ
[VERSE 2]
Ezumike ndị nọ n'ije
Onye ntasi obi Muọ nsọ
Wusa mmiri n'ebe kpọrọ nkụ
Muọ nsọ duzie ụkwụ gahie ụzọ
Oh Muọ nsọ
Nye anyị onyinye Gị
Onye ntasi obi Muọ nsọ
Gbaghara 'nyị njọ
Gị bi Muọ nsọ
Onye ntasi obi Muọ nsọ
Nye anyị aṅụrị na ndụ ebeebe
Muọ nsọ
Onye ntasi obi Muọ nsọ
[DOXOLOGY]
Nye Chukwu Nna otito na nsọpụrụ
Nye Chukwu Nwa otito na nsọpụrụ
Nye Chukwu Muọ nsọ otito na nsọpụrụ
Ọ bụ to na ngọzi
Onye ntasi obi
Nna ndị ogbenye
Amen, Amen, Amen