Full Lyrics
REFRAIN
Chidinma. Ị dị nma, Chine'me nma
Onye n'enye onyinye Chineke, Onye nma.
Onyinye mara nma kam jiri bịa n'iru Gị
Ị dịịrị mu nma Chidinma Onye nma.
VERSE 1
Dịka onye nche si atụ anya chi ọbụbọ
Ka mkpụrụ obi m si eche Dinwenu
Ihe I naemere m Chineke ọ juru m anya
Ị dịịrị mu nma Chidinma Onye nma.
VERSE 2
Ka onye nche chekwube chi ọbụbọ
Ma mu n'ezi n'ụlọ mu chekwube Dinwenu
Ihe I naemere m Chineke ọ juru m anya
Ị dịịrị mu nma Chidinma Onye nma.
VERSE 3
I nyere m amamihe agam ekele Gị
I nyere m ọgụgụ isi agam ekele Gị
Ihe I naemere m Chineke ọ juru m anya
Ị dịịrị mu nma Chidinma Onye nma.
VERSE 4
Ọ bụ akụ n'ụba? Ọ bụ ihe onwunwe?
Ọ bụ ego? Ọ bụ akwa? Ọ bụ nwa?
Ihe I naemere m Chineke ọ juru m anya
Ị dịịrị mu nma Chidinma Onye nma.