CHIDINMA by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Chidinma. Ị dị nma, Chine'me nma Onye n'enye onyinye Chineke, Onye nma. Onyinye mara nma kam jiri bịa n'iru Gị Ị dịịrị mu nma Chidinma Onye nma. VERSE 1 Dịka onye nche si atụ anya chi ọbụbọ Ka mkpụrụ obi m si eche Dinwenu Ihe I naemere m Chineke ọ juru m anya Ị dịịrị mu nma Chidinma Onye nma. VERSE 2 Ka onye nche chekwube chi ọbụbọ Ma mu n'ezi n'ụlọ mu chekwube Dinwenu Ihe I naemere m Chineke ọ juru m anya Ị dịịrị mu nma Chidinma Onye nma. VERSE 3 I nyere m amamihe agam ekele Gị I nyere m ọgụgụ isi agam ekele Gị Ihe I naemere m Chineke ọ juru m anya Ị dịịrị mu nma Chidinma Onye nma. VERSE 4 Ọ bụ akụ n'ụba? Ọ bụ ihe onwunwe? Ọ bụ ego? Ọ bụ akwa? Ọ bụ nwa? Ihe I naemere m Chineke ọ juru m anya Ị dịịrị mu nma Chidinma Onye nma.

Download the sheet music

CHIDINMA

CHIDINMA

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
2 pages
5 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want