Full Lyrics
REFRAIN
Aja dị nsọ
Aja dị ok'ọnụ k'ụmụ Chineke n'achụrụ Chukwu.
Aja 'nyị naachụrụ Chukwu b'onwe anyị,
Ahụ na mkpụrụ obi anyị
Nara, Nna nara,
Nar'onyinye ụmụ Gị, nara Aja dị nsọ.
VERSE 1
Anyị ekele Gị mak'ọgọ Gị niile,
Chukwu biko nar'aja, nara ụmụ Gị gọzie.
Anyị ekele Gị maka afọma Gị
Anyị ekelegi Nna maka ngọzi Gị
VERSE 2
Anyị enye Gị nsọpụrụ na otito kachaelu
Anyị edoo Gị ebube Nna Onye kachaelu
Anyị ebunye Gị iko Nsọ, biko nara ya
VERSE 3
Anyị arịọ Gị mgbaghara njọ anyị
Anyị arịọ Gị ebere n'obodo anyị
Anyị arịọ Gị gratia na ngọzi niile