AJA Di Nso by Fred V. C. Uche — Lyrics

Fred V. C. Uche Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Aja dị nsọ Aja dị ok'ọnụ k'ụmụ Chineke n'achụrụ Chukwu. Aja 'nyị naachụrụ Chukwu b'onwe anyị, Ahụ na mkpụrụ obi anyị Nara, Nna nara, Nar'onyinye ụmụ Gị, nara Aja dị nsọ. VERSE 1 Anyị ekele Gị mak'ọgọ Gị niile, Chukwu biko nar'aja, nara ụmụ Gị gọzie. Anyị ekele Gị maka afọma Gị Anyị ekelegi Nna maka ngọzi Gị VERSE 2 Anyị enye Gị nsọpụrụ na otito kachaelu Anyị edoo Gị ebube Nna Onye kachaelu Anyị ebunye Gị iko Nsọ, biko nara ya VERSE 3 Anyị arịọ Gị mgbaghara njọ anyị Anyị arịọ Gị ebere n'obodo anyị Anyị arịọ Gị gratia na ngọzi niile

Download the sheet music

AJA Di Nso

AJA Di Nso

By Fred V. C. Uche
Solfa
Igbo
1 page
3 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want