AGA M EJE N'ALTER by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Communion Hymns Hymns Eucharistic songs Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN A ga m eje nar'Ahụ Kristi A ga m eje n'alter wee nar'Ahụ Kristi Ahụ Dinwenu Jesu Kristi n'enye ndụ Nriọma Kristi n'enye ndụ Nriọma VERSE 1 Kristi kwuru sị, "A bụ m Achịcha ndụ, A bụ m Achịcha ndụ nke si n'eligwe bịa n'ụwa, Onye ọbụla riri ya b'Achịcha ọ gaenwe ndụ ebighebi Nriọma, Kristi naakpọ m o, ka m aga maza" VERSE 2 Dinwenu kwuru sị, "A bụ m ndụ A bụ m mbilite n'ọnwụ, a bụ m ndụ Onye ọbụla kwere na m ọ gaghị anwụ anwụ Ọbụrụ na ọ nwụrụ anwụ ọ gaadị ndụ o Nriọma, Kristi naakpọ m o, ka m aga maza" VERSE 3 "Ọbụrụna unu erighi Ahụ m o Ọbụrụna unu aṅụghị ọbara m o Unu ama enwe ndụ n'ime unu" Ọ kwu Jesu Achịcha n'enye ndụ Nriọma, Kristi naakpọ m o, ka m aga maza"

Download the sheet music

AGA M EJE N'ALTER

AGA M EJE N'ALTER

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
2 pages
9 Downloads
Communion Hymns Hymns Eucharistic songs
0 0

More lyrics you may want