Full Lyrics
[REFRAIN]
Zukotanu ndị a gọziri agọzi,
K'anyị jee fee Chineke.
Zukotanu k'anyị jee nye Chineke Nna ezi otito.
Ọ bụ Onyeọma, Ọ bụ Onyeọma,
Ọ bụ Onyeukwu ezie, Ọ bụ Onyeọma ezie.
Ezuwanile.
[VERSE 1]
Otito dị elu k'anyị naenye ya,
Onye kere ụwa nile,
Chọọ ya mma, naechekwaba ya oge nile.
Zukotanu...
[VERSE 2]
Mba nile gaakpọ isiala nye gị,
Sekpuoro gị, kwupụta na Ị bụ Onyeọma.
Ezuwanile, zukotanu...
[VERSE 3]
Ihe nile I kere naeto gị,
Mmadụ I kere naeto kwa gị,
Nara otito anyị biko.
Ezuwanile, zukotanu...
[VERSE 4]
Otito dịrị, dịrị Ya ebebe,
Ugwu nile na nsọpụrụ, ịja mma dịrị ya.
Ugwu nile na nsọpụrụ, ịja mma dịrị ya.
Ezuwanile...
[SOPRANO SOLO]
Bịanụ kelee ya, Ọ bụ eze, Ezuwanile.
Eze ndị eze, k'anyị gbara ya egwu,
Egw'ụmụ ọgaranya, egwu dị mma,
Egwu nganga ịgba ndị eze.
Alaeze ya adịghị ka nke ụwa,
Kama alaeze ya gaadịgide ruo ebighebi.