Full Lyrics
REFRAIN
Zidata Muo gi, O Osebruwa,
ko mee ka ihu uwa nke a k'o di ohuru.
VERSE 1
Gozie Osebruwa O mkpur'obi mo,
Oseburuwa Chukwu, I di nnukwu ebube.
Lee k'oru gi siri juputa n'ebe nile Osebruwa,
Uwa nile Osebruwa juputara n'uba gi.
VERSE 2
Oburu n'iwere kwa Muo gi,
ha nile anwurusia wee lachigha n'etum,
lachigha n'etum ha si wee puta.
I zidatara Muo gi ekee ha,
I wee mee ihu uwa nke a k'o di ohuru.
VERSE 3
K'otito diri Osebruwa ebebe,
k'Oseburuwa nwee anukwu anuri n'oru ya nile.
Ka uche m dimma n'ihu ya,
n'Oseburuwa, kam n'enwe anuri.