Full Lyrics
[SECTION A]
Ụmụnne m tima nụ m kpuọ nụ tishie y'ike
Sh'onye nọ n'etiti unu wụ Onye Nsọ nke Izrel
Ngwa nụ ụmụnne m tima nụ m kpuọ nụ tishie y'ike
Nwa nne m Onye nọ n'etiti unu wụ Onye Nsọ nke Izrel
[SECTION B]
K'anyi je kaara ha, je kaara ndị niile n'ata ahụhụ n'ime njọ
Ha sị a mụọ m onye a mụma Aịzaya buru emezuola
Sị a kwa ya kwuru sị nwa agbọghọ naamaghị nwoke gaatụ ime
Mụọ nwa, bịa lemanụ Imanuel
Gbama vụ kuma mgbirigba Ekeresimesi o
Kuma mgbirigba Ekeresimesi o
Ku shie y'ike kuma nụ mgbirigba
Kuma mgbirigba Ekeresimesi ku shie y'ike
Kuma mgbirigba Ekeresimesi
[OSTINATO FOR SOLO VOICE]
Ku ma mgbirigba Ekeresimesi sha
Vejin Maria mụọrọla anyị nwa wụ Eze ụwa niile Imanuel
Gama n'ugwu na ndida niile
Tima m kpuọ nụ tishie nụ y'ike
Sị ha kpọmara nụ y'ishia la shọ wụ Imanuel
Meria mụọla sị sha Meria mụọrọla anyị nwa
[TUTTI (ACAPELLA)]
Imanuel, Nwa ka nwa Imanuel
Ezi Nwa ka nwa Imanuel
Nwa ka nwa Imanuel
Kpọọ ya Imanuel
[ACCOMPANIMENT]
Jesu abịala, Eze Nwa ka nwa Imanuel
[PART C (ACAPELLA)]
Bịanụ k'anyi jema, k'anyi je ma nụ na Betelehem
Ebe a mụrụ Nwa ka nwa
Bịa manụ k'anyi jema, shianyi je lee anụ nụ Eze Jesu
[CON SPIRITO]
Dinwenu ji kere kaara mue bọ nakpọ o!
K'anyi sh'olee bọ ne me mam
K'anyi je, k'anyi jema nụ na Betelehem
K'anyi je kpọọrọ Jesu ishiala
Eze' bube o, Mezaya
Ebube dike k'o bụ Chukwu ọma
Ome a Nna ya, O yiri Nna ya, O ri a Nna ya, O yiri Nna ya
Jesu Imanuel
Sh'ụna hụ nla kpọ bashi bi n'igwe ji n'edzie ụmụnnem
Sh'ọ gaadịrịla anyị mma
N'edzie ụmụnnem sh'ọ gaadịrịla anyị mma
Lemanụ sh'ọ gaadịrịla anyị mma, Amen
Ngwa k'anyi jema nụ
[PART D]
Ngwa k'anyi weje renu y'ọlaedo frankinsensi na mee
Kuma mgbirigba Ekeresimesi
Sh'ọhụsọ Onye kwunụ sị a h'ọma ma mma
Onye nọ n'etiti unu wụ Imanuel
Kpọnụ ya Imanuel, Nwa ka nwa Imanuel
[FINALE]
Imanuel, Eze' bube Jesu Imanuel
Nwa ka nwa Imanuel