Full Lyrics
REFRAIN
Ụmụ Chineke gaa n'iru, gaa nye Chineke ihe ọma
Ọ bụ Chineke bụ Onyinye dị mma
Onye nwe Onyinye dị mma
Ụmụ Chineke gaa n'iru Nna
Nye y'onyinye dị mma.
VERSE 1
Ngị Chukwu bụ Onye dị mma
Sọ Ngị bụ eze
Kerụwa niile
Sọ Ngị Chukwu bụ Onye
Onyinye Chineke biko nar'onyinyanyi
VERSE 2
Sọ Ngị Chukwu naagọzi ndị Gị
mgbe niile
n'ebe niile
nara Chukwu Onyinye ndị Gị
O Chineke biko nar'onyinyanyi
VERSE 3
Na Ngị Chineke k'obi m gbabara
O Chukwu ji ndụ
n'onyinye niile
ihe niilem nwere si n'aka Gị
O Chineke biko nar'onyinyanyi
VERSE 4
Otu ndị mmadụ ji ngala
mebie onyiny'enyere ha
ma gọzie Chineke Onye nye ndị nke Gị
O Chineke biko nar'onyinyanyi
VERSE 5
Ego n'enyere ndụ aka
Ọ bụgh'isi ndụ
Ọ bụghị ndụ n'onwe ya
Onye Chukwu gọziri kelee Chi ya
O Chineke biko nar'onyinyanyi
VERSE 6
Akụdụbam bụ Chukwu nwe ha
Aga m'eji ha
we jeeye Chineke ozi
maka m Onye n'enye ka O n'enye nma ji
O Chineke biko nar'onyinyanyi