Full Lyrics
REFRAIN
Onyenweanyi meenu k'im'uche Gị bụrụ nri m
Ka agụụ im'uche Gị chụwe m ụra
Ka im'uche Gị nyewe m afọjuju.
VERSE 1
Ngozi dị elu n'agba h'okirikiri
n'ezie amara zuru ke n'awa kịyị
na ndụ ha bụ ndị n'anabata uche Chineke.
VERSE 2
Jesu, Virgin Maria na ndị nsọ nile
mer'uche Nna ha hụjuru anya
mana ha nọzi n'otitugbo a Nna mee
Kanyị si n'ahụhụ mez'uche Gị wee
ket'añụrị, añụrị Gị dị ebighebi.
VERSE 3
Uche Chukwu,
Ka ndị mmụọma mer'uche Gị
O! Chineke
na ndị nsọ mer'uche Gị
nọrubanyị okirikiri
mgbe b'iri n'ụwa
ji atụa nyị uche Chineke, uche Chineke.
VERSE 4
Jesu,
Onyenri Ya bụ im'uche Nna rịọtara anyị ngozi ime
na ịnabata uche Nna
Ka n'ahụhụ ka n'añụrị.