Full Lyrics
REFRAIN
Onye nwe anyị mee nụ k'ime uche Gị bụrụ nri
Uche Chineke, ka agụụ ime uche Gị
Ka ọ chụwe m ụra, ka ime uche
Gị nyewe m afọ ojuju.
VERSE
Ngọzi dị elu n'agba ha okirikiri n'ezie
Amara zuru oke n'awa kịkịrị na ndụ ha
bụ ndị naanabata uche Chineke.
Jesu, Virgin Maria ma ndị Nsọ niile
mer'uche Nna ha hụjuru anya.
Mana ha nọzi n'otito ugbua
Nna mee doo k'anyị si n'ahụhụ meg'uche Gị
wee keta añụrị, añụrị Gị dị ebighebi.
Uche Chineke, ka ndị Mmụọ ọma mer'uche Gị
O! Chineke, na ndị Nsọ mer'uche Gị
nọrube anyị okirikiri mgbe ebili nk'ụwa ji atụ anyị egwu.
Jesu Onye Nri Ndụ, bụ ime uche Nna
rịọta n'anyị ngọzi ime uche Nna
ka n'adu hu na ị naabata uche Nna
kama añụrị.