Bịanụ K'anyị Kpọọ Ịsịala by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Entrance songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Taata bụ ụbọchị Chineke mebere Ke mebere ndị dị ngọzi nke Ya Iji nye y'ofufe n'ụlọ Ya dị asọ Bịanụ k'anyị kpọọ isiala Nye Chineke Onye kachanụ Bịanụ k'anyị kpọọ isiala nye Chineke Onye kach'elu [VERSE 1] Chukwu anyị dị mma lekenekwa sịrị kee mmadụ Nye y'echiche nye y'ọgụgụ isi chọọ ya mma; mana mmadụ n'ejehie ụzọ site n'iwere nsọpụrụ dịrị sọ Chukwu naenye n'ekweleke [VERSE 2] O Chineke lee ụmụ a ndị bịar'inye Gị ekele meghe ntị anyị k'anyị nụrụ ozi ọma Gị gbaghara mmehie anyị nile [VERSE 3] N'ebe kacha elu Nye Ya nye y'otito n'ebe kach'elu Ya mere k'anyị duba nile zie nye Ya otito n'ebe kach'elu Nye y'otito mekwa ka mba nile dị n'ụwa nweta nzọpụta n'ime Kristi nye Ya, nye y'otito n'ebe kach'elu Bịanụ k'anyị kpọọ isiala nye Chineke Onye kach'elu Nke Onyenwe m na Chineke Nna m Onye kach'elu Nye y'otito n'ebe kach'elu Nye Ya, nye y'otito n'ebe kach'elu Otito n'ebe kach'elu

Download the sheet music

Bịanụ K'anyị Kpọọ Ịsịala

Bịanụ K'anyị Kpọọ Ịsịala

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
4 pages
4 Downloads
Entrance songs Hymns
0 0

More lyrics you may want