SACHA NWA GI by Chibi — Lyrics

Chibi Igbo Lenten Hymns Holy Week Hymns Prayer Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Abụ m nwa gị Kristi onye e jiri maka njọ ya kpọgbue gị, Echetakwala njọ m Chineke m o, Onye nwe m o, bịanụ sachanụ nwa gị. [VERSE 1] Chukwu ahụrụ m gị n'anya karịsịa ihe niile, Eji m obi m chegharịa na mmehie m mehiere gị, Bịanụ gbaghara m o Chineke chefuo njọ m o. [VERSE 2] Olisigwe, bịanụ sachanụ nwa gị. N'ebe ị nọ ekwela ka m kewapụ onwe m, Were m mee ihe masịrị gị. [VERSE 3] Gee ntị n'olu naasị kedu ihe m mere e jiri kpọgbue m o n'obe? Maka gị ka e jiri kpọgide m o. Ọ naasị kedu ihe m mere e jiri kpọgbue m o? Ọkwa maka gị ka e jiri kpọgide m o. Ka m jụọ kedu ihe o mere e jiri kpọgbue ya? Ọkwa maka m o ka e jiri kpọgide ya n'obe? Maka m o ka e jiri kpọgide ya. Ọlụ ahụ n'eti na asị n'ọbụ maka m o ka e jiri kpọgide ya, obi m nọ na nwute, Mee m ka m dị ọcha oge niile sachanụ m o Nna. Kedu ihe o mere e jiri kpọgbue ya? Ọkwa maka m o ka e jiri kpọgide ya. Ka m bụrụ enyi gị.

Download the sheet music

SACHA NWA GI

SACHA NWA GI

By Chibi
Staff & Solfa
Igbo
2 pages
1 Downloads
Lenten Hymns Holy Week Hymns Prayer Hymns
0 0

More lyrics you may want