Full Lyrics
REFRAIN
Leenu ya i n'anyi bu k'o bu na nbu
Leenu ya ihe o bu ugbu a
K'anyi niile g'abu cha
Mgbe oge g'eru
VERSE 1
O kw'e buru ozu onye ozo
O di k'e bu osisi kporo nku
Lekwanu n'o bu uz'ahu
O gara ka anyi niile g'aga
VERSE 2
Mkpuru ubochi ole gara aga
Anyi na ya no
Anyi na ya n'ekwukorita, kwu n'akpa nkata
Ma n'ugbu a o nozi n'ozu
VERSE 3
Leenu onye anyi na ya n'erie ri, anu anu
K'o dina n'ozu
Uwa nke a enweghi isi
Uwa bu ihe nkiti
VERSE 4
Leenu ya bianu huru ya
Ihe ahu o bu tata k'anyi niile g'abu cha
Mgbe oge g'eru
VERSE 5
Ezi nwa nnem juo onwe gi ajuju
Onye k'o gaabu echi
O bu mu k'o bu ngi
Onye obula kwado onwe ya na o g'agwula