Full Lyrics
[Soprano]
Tobe nụ Dinwenu na ọmeka too nụ
Dinwenu nye ya otito dịrị ya, tobe nụ Dinwenu
Bịa nwanne m nye ya otito n'ọ kwesịrị ya
Nye ya otito, tobe nụ Dinwenu
Bịa nwanne m nye ya otito n'ọ kwesịrị ya
Tobe nụ Dinwenu ya, nye ekene, ekene, ekene
[Baritone Solo]
Nye nụ ya, nye nụ ya, nye nụ ya ekene
Nkume ebighi ebi, echeta obi esie ike
Ekene o, anyị bịara ị kene, jaa gị mma
Nye gị ofufe, nye gị ndokwa
Nara ekene na ihe nine anyị nwere bụ nke gị
Ihe nine anyị bụ bụ nke gị
Ekene, ezi Chi ekene o
[Soprano]
Nye otito, otito, bịa ka anyị nye ya otito n'ọ kwesịrị ya
Tobe nụ Dinwenu na ọmeka too nụ
Dinwenu nye ya otito dịrị ya, tobe nụ Dinwenu
Bịa nwanne m nye ya otito n'ọ kwesịrị ya
Tobe nụ Dinwenu ya
Ekene, otito, mbuli, ọjịja ya bụ ihe anyị ji
Bịa n'ụlọ nsọ gị
Okwukwe anyị Nna dị n'ime gị
Olileanya ndị kwere nụ
Nwanne m bataba, bataba, bataba, bataba
Ka anyị nye ya otito n'ọ kwesịrị ya
Tobe nụ Dinwenu na ọmeka too nụ
Dinwenu nye ya otito dịrị ya, tobe nụ Dinwenu
Bịa nwanne m nye ya otito n'ọ kwesịrị ya
Tobe nụ Dinwenu ya
Bịa k'anyị nye ya otito, otito kwesịrị ya
Bịa o, n'ọ kwesịrị ya