Full Lyrics
INTRO
Otito dịrị Chineke n'elu kach'elu n'ụwa udo dịrị ndị mma.
VERSE 1
Anyị ajaa Gị mma, anyị agọzie Gị,
Anyị asekpụọrọ Gị, anyị atọọ Gị,
Anyị ekele Gị n'ihi nnukwu ebube Gị.
REFRAIN
Otito n'elu k'achaelu, Otito.
VERSE 2
Oseb'ruwa Chukwu Eze nke eluigwe,
Chukwu Nna ji'ke nile,
Dinwenu Jesu Kristi so otu Nwa Chineke mụrụ.
VERSE 3
Dinwenu Chukwu Nwa atụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna,
Gị onye n'ekpochapụ njọ nk'ụwa,
Mee r'anyị ebere, mee ebere.
VERSE 4
Ngị Onye n'ekpochapụ njọ nk'ụwa,
Nara arịrịọ anyị,
Ngị Onye nọ n'aka nri Nna,
Mee r'anyị ebere, mee ebere.
VERSE 5
N'ihi na sọ Gị dị nsọ,
Sọ Gị bụ Dinwenu, sọ Gị Jesu Kristi kacha dị elu,
Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna. Amen.