Full Lyrics
CANTOR:
Otito diri Chineke n'elu kach'elu!
CHOIR:
N'uwa udo diri ndimmadu ndi nwere obi oma.
Anyi ajaa Gimma;
Anyi esekpuoro Gi;
Anyi agozie Gi;
Anyi etoo Gi;
Anyi ekelee Gi n'ihi nnukwu ebube Gi.
Oseburuwa Chukwu; Eze nke eligwe,
Chukwu Nna ji ike nile.
Dinwenu Jesu Kristi, so otu Nwa Chineke muru;
Dinwenu Chukwu, Nwaturu nke Chineke, Nwa nke Nna.
Gi onye n'ekpochapu njo nk'uwa, meere anyi ebere;
Gi onye n'ekpochapu njo nk'uwa, nura aririo anyi;
Gi onye no n'aka nri Nna, meere anyi ebere.
N'ihi na so Gi di Nso;
So Gi bu Dinwenu;
So Gi Jesu Kristi kachasi di elu,
Gi na Muo Nso n'ebube Chukwu Nna.
Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen!
Amen.