Full Lyrics
INTRO
Chineke Chukwu, na ekele njiri bịa n'ihu gị
Maka ihe ị naemere m eh
A bịara m ka m sị gị dalụ ngọzi Chi m o
CHORUS
Kwamgbe Chineke n'emere m mma eh
Kwamgbe k'ọ n'eleta m o
N'ajụ n'ọ bụ sọ m k'ọ hụrụ n'anya
Lekwanụ m o, gịnị ka m bụkwanụ n'ụwa
O jie leta m o mgbe dum, mgbe nile
Kwamgbe nwanne m, ihe o mere m o eh
Ọ n'echu m ụra, a sị m a ga m akọ
Kwarụwanụ le ihe o mere m o
Ụmụ nne m bịakwanụ hụrụ na Chineke n'emere m mma
Kwamgbe kwamgbe, ọrụ ọma ya
Kwamgbe kwamgbe, n'emere ndị ya
Kwamgbe kwamgbe
VERSE 1
Akụkọ juru m ọnụ mana maghị m ebe m gaebido
Lekel' ọrụ ebube Chi m naarụrụ m o n'elu ụwa
Nwanne m tule kele, ka ị hụrụ n'o tefefe
Hụrụ gị n'anya, gbara ya egwu, tere ya egwu
Bute onyinye m o, ya ekwe?
Kpọrọ ya ụdụ dum? Dum dum ekele ka m gaenye ya
Ọ bụ onye ọma ọ n'emere m o ihe ọma
VERSE 2
Ihe m naatụghị anya ka Chineke meere m
Were tinye jara ebe ị naeleghị anya
Ka Chineke bugoro gị, me gị mma
Jaba Chineke m, ị gaekwe ma
Kwamgbe to, bunye ya onyinye kwamgbe
VERSE 3
Onye ọma k'ị bụ, ịhụnanya gị dịka okosimiri o
Kaka ghari o leni ihe ọma o naemere m o
Ọ n'echebe m o kwamgbe kwamgbe
Ọ n'eduba m o kwamgbe kwamgbe
Ọ naakwọrọ m ụzọ, ọrụ ọma Chineke naarụrụ m bụ kwamgbe
Ikuku n'enye m ndụ kwamgbe
Ihe oriri bụ kwamgbe
Mmeso ọma ya bụ kwamgbe
Ihe ọma nile bụ kwamgbe
Gịnị k'ị gaemere Chukwu?
A ga m enye gị ekele kwamgbe
Nye ya otito kwamgbe
A ga m aga n'ihu ya ekele, Chi m imela to kwamgbe
CODA
Ngọzi Chineke barụba n'ezie
Lele m o, lele m o, ọ naawụsa n'amara ya nke barụba n'ezie
Kwamgbe kwamgbe kwamgbe kwamgbe
Mgbe nile, oge nile, Chineke m gọziri m o
Mgbe nile ka Chineke n'eleta m
M were jụọ onwe m sị, ọ gịnị ka m gaemere Chi m o
A ga m ebuli ite iko nzọpụta elu
Gọzie aha ya, bulie aha ya, kpọkuo aha ya
K'anyi jebe jebe jebe kwante kele ya
Kele ya mgbe dum
Barụba n'ezie