Full Lyrics
REFRAIN
Bute onyinye obi ọcha
Bute onyinye maramma
Onyinye siri n'ezi obi gị pụta mgbe obi gị dị ọcha
Buru ya bịa n'ihu Chineke
VERSE 1
Ngọzi Chukwu dị n'ụdị n'ụdị
Onyinye ya a baka ụba
O nwere ndị o nyere onyinye n'ụwa ezuo
Nke o nyere gị nara
Kwere ọ gaagọzikwa gị
VERSE 2
Onye arịrịọ nọ n'ihu gị
Chọba obere ego
Ọ kwa nke kacha obere ego
I chezọgọ na Chukwu n'ele gị?
Wee rịọ ya arịrịọ
Ọ sị etu ahụ mee gị obi ọ gaadịkwa gị mma
Nwannem ọ sị etu ahụ mee gị obi ọ gaadịkwa gị mma
VERSE 3
I bumkpa gịnị ile wee bịa n'ụlọ nsọ Chukwu,
Oge onyinye erugo
Nyochabakpa chọba obere ego
Ọ bụrụ na Chineke urungozi ya bata;
Kee ya keesi enye onyinye,
Kwa ị taba onwe gị ụta