Full Lyrics
REFRAIN
Onyinye mara mma k'anyi g'ebunye Chukwu.
Buru ihe onyinye gị bute n'altar Chukwu nwannem.
Onyinye si n'obi k'anyi g'enye ya ọ n'asọ ya.
Onyinye mara mma k'anyi g'enye Chukwu.
VERSE 1
Any'ihir'ụra n'anyasị tita n'arụ isike.
Anyi pụrụ ọrụ n'ụtụtụ nata n'arụ isike.
Ọgịnị k'anyi g'eji kelee Olisa bi n'igwe.
VERSE 2
Chukwu nyere anyi nwa.
Chukwu nyere anyi ego,
Chukwu nyere anyi akụ n'ụba ma gọzie anyi.
Ọgịnị k'anyi g'eji kelee Olisa bi n'igwe.
VERSE 3
M'ọdị mma m'ọdị njọ anyi ga n'ekele
Chukwu ker'anyi.
Ọgịnị k'anyi g'eji kelee Olisa bi n'igwe.
VERSE 4
Ị ga agọkwu agụgọ n'ọnweghị ihe Chukwu mere gị
ndụ ị dị ọkwa Chukwu nyere gị ya.
Ọgịnị k'anyi g'eji kelee Olisa bi n'igwe.