Full Lyrics
CHORUS
Onyenwaanyi I dị mma, mma, mma, I dị mma,
Onyenwaanyi I dị mma, mma, mma, I dị mma,
bụrụkwa onye n'agbaghara mmehie
bịa, bịa, bịa bata n'ime m, biko bata, bata n'obi na,
onye mmehie sachapụ m o, Nna doo mụ nsọ.
VERSE 1
Obi ọma Gị ebuka n'ebe m dị n'akpọku Gị nọ
biko Onyenwem tọọ ntị n'aza m o,
biko Onyenwem tọọ ntị mee ebere za m o, Nna,
za m o, biko Onye nwem za m oku nke m n'akpọ Gị.
VERSE 2
Onyenwem, Onyenwem, mba niile I kere g'abịa
kpọọrọ Gị isi ala, ikpere ala, kpọọrọ Gị isi ala
ha gaeto aha Gị, too, too, too, toogide aha Gị,
maka n'Ị bụka, ọlụ Gị dị ebube o, Nna, onye nwem,
Sọ Gị bụ Chineke.
VERSE 3
Onyenwaanyi I bụ Chineke, onye ebere n'amara, Ị naghị ewe iwe ọkụ
Ị jupụtara n'obi ọma
mezuo nkwa I kwere, chee m ihu, Nna biko meere m ebere,
were ike Gị nye nwadibo Gị.
VERSE 4
Aga m eji onyinye I nyere m o kwupụt'otito Gị n'ihu mmadụ niile.
na ndụ m niile, aga m eji ire m gbakebe ihe ọma niile,
ọrụ ọma niile I n'arụrụ m o na ndụ m niile.
SOPRANO SOLI
Sị ihe ọma I n'emere m o, ak'ebe
ihe ngọzi, ihe ngọzi
ọrụ ọm'I narụrụ m o
SOPRANO SOLI LINES
1. ndụ n'ahụ ike m o
2. nchekwa I n'echekwa m o
3. kedu kwanụ maka mamịhẹ
4. akụ n'ụba m o
5. ehihie n'abalị
6. ọkọchị n'ụdụ mmiri
7. aga m akọle gharole?