ONYE PURU IBANYE N'ULO NSO GI? by Ezeh J.O Ezeh — Lyrics

Ezeh J.O Ezeh Igbo Entrance songs Responsorial Psalms Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Onye puru ịbanye n'ụlọ nsọ Gị? Dinwenu a na m ajụ sị, Onye puru ịbanye n'ụlọ nsọ ukwu Gị? Ajụjụ m bụ... O Dinwenu oge nile. VERSE 1 Onye nweghị njọ ọbụla na ndụ ya, Bụ onye gaabata. Onye aka ya kwụ ọtọ, Bụrụ onye eziokwu dị n'obi ya, Abata n'ụlọ Dinwenu. VERSE 2 Onye a naghị ekwuto ndị ọzọ, Onye a naghị eme onye agbata obi ya ihe ọjọọ, M'ọbụ boo ya ebubo asị o. VERSE 3 Onye n'eleda ndị a maghị Chineke anya, Onye n'asọpụrụ ndị n'atụ egwu Chineke, Onye n'emeju nkwa o kwere mgbe nile o. VERSE 4 Ọ gaabụkwa o onye n'ebinye ego, Onye n'ebinye ego, e ye, Onye n'ebinye ego na anaghị anara ọmụrụ nwa. Onye a naghị eri ngari iji megide Onye nweghị ihe o mere.

Download the sheet music

ONYE PURU IBANYE N'ULO NSO GI?

ONYE PURU IBANYE N'ULO NSO GI?

By Ezeh J.O Ezeh
Solfa
Igbo
2 pages
3 Downloads
Entrance songs Responsorial Psalms Hymns
0 0

More lyrics you may want