Full Lyrics
CHORUS
Onye puru ịbanye n'ụlọ nsọ Gị?
Dinwenu a na m ajụ sị,
Onye puru ịbanye n'ụlọ nsọ ukwu Gị?
Ajụjụ m bụ... O Dinwenu oge nile.
VERSE 1
Onye nweghị njọ ọbụla na ndụ ya,
Bụ onye gaabata.
Onye aka ya kwụ ọtọ,
Bụrụ onye eziokwu dị n'obi ya,
Abata n'ụlọ Dinwenu.
VERSE 2
Onye a naghị ekwuto ndị ọzọ,
Onye a naghị eme onye agbata obi ya ihe ọjọọ,
M'ọbụ boo ya ebubo asị o.
VERSE 3
Onye n'eleda ndị a maghị Chineke anya,
Onye n'asọpụrụ ndị n'atụ egwu Chineke,
Onye n'emeju nkwa o kwere mgbe nile o.
VERSE 4
Ọ gaabụkwa o onye n'ebinye ego,
Onye n'ebinye ego, e ye,
Onye n'ebinye ego na anaghị anara ọmụrụ nwa.
Onye a naghị eri ngari iji megide
Onye nweghị ihe o mere.