Full Lyrics
CHORUS
Onye puru ibanye n'ulo nso Gi?
Dinwenu a na m aju si,
Onye puru ibanye n'ulo nso ukwu Gi?
Ajuju m bu.
O Dinwenu oge nile.
VERSE 1
Onye nwegh' njo obula na ndu ya,
bu onye g'abata.
Onye a ka ya kwuo oto,
buru onye eziokwu di n'obi ya,
ndi di otua bu ha ga gaba n'ulo Dinwenu.
VERSE 2
Onye anaghi ekwuto ndi ozo,
emee onye agbata obi ya ihe ojoo,
m'obu bo ya ebubo asi.
VERSE 3
Onye n'eleda ndi amaghi Chineke anya,
onye n'asopuru ndi n'atu egwu Chineke,
o ga bu onye n'emeju nkwa o kwere mgbe nile.
VERSE 4
O ga bu kwao onye n'ebinye ego,
onye n'ebinye ego, eye,
onye n'ebinye ego na anaghi omurunwa.
Onye anaghi eri ngari iji megide onye nwegh' ihe o mere.