Full Lyrics
[REFRAIN]
Ngozi, ngozi, ngozi, ngozi Chukwu n'ezo ka mmiri.
Ngozi Chukwu juru m ahụ o, Chukwu Nna gọzigo m o,
Ụwa bja lele ọmarịcha, ọmarịcha ihe Chukwu Nna mere m o.
Kedu nụ ụdị asụsụ m gaeji wee kele Chukwu?
Ọ bụ Hausa, k'ọ bụ Yoruba k'ọ bụ Igbo?
M sụba supiri, supiri, supiri, supiri, supiri, supiri, supiri, supiri, ọ gaghị ezuru m o.
Gịnị ka m gaeme?
M'ekwenti m o ka m kpọọ Olisa bi n'igwe sị ya n'o meela o.
A gam aja ya mma maka n'ọ bụ Onye ngozi.
Dike! Dike! Dike!
Mun gode Allah, Allah Sarki.
Baba, ẹ ṣe o.
Daalụ Chineke m o, daalụ n'ị meela Chukwu.
[VERSE 1]
Ọñụ m n'eju k'osimiri, ngozi Chukwu barụba.
Ihe m naachọ n'ukwu elu ka Chukwu nyere m n'ukwu ala.
Nke a ka bụ mbido, anụ na nnukwu naabịa.
Ihe ọma Chukwu n'eme adịghị agụta ọnụ.
[VERSE 2]
A gam esi aña wee kele Gị ee, Chukwuigwe,
Gịnị ka m gaeji wee tuoro Gị mmamma, mmamma, mmamma dịrị Gị Ony'ọma.
Ebi n'esiri m ọnya wee mee m Onye ngozi,
Nara ekele Ony'ọma, Ony'ọma, m naesi n'ala t'obim pụta Ony'ọma.