Full Lyrics
CHORUS
Ony'akpọgburu n'obe Ọ bilitego,
Ony'akpọgburu n'obe esigo n'ọnwụ kulie.
Ekele dịrị Jesu onye mmeri, Jesu onye nwụrụ n'ihi m,
Ekele dịrị Dinwenu onye gbapụtara mo.
VERSE 1
Kristi Dinwenu, Ọ biara n'eluwa,
wee kwer'ọnwụ, ọnwụ n'eluobe,
Ọ kwere ọnwụ n'ihimo maka ya k'Ojiri gbapụta mo.
Ahụhụ niile Ọ tara n'ụwa ewuteghi Ya maka...
VERSE 2
Olu ndị mmụọzi jụrụ Meri kedu ih'I jieberekwa?
H'eburugo Dinwenu amaghịm ihem g'eme,
amaghịm ebe ha dobere Ya ewo!
H'eburugo Dinwenu.
Ma Jesu jụkwara ya nwaanyị, kedu ih'I jieberekwa?
Ọbụrụ n'ọbụ gị buru Ya, biko gwam eb'I dobere Ya kam buru Ya.
Meri amataghị n'Ọbụ Kristi mana mgb'Ọ kpọrọ ya aha, Ọ tie Onyenkuzi.
Meri wee gboso jee gwa ụmụazụ, Ahụrụ m Dinwenu Ọ sigo n'ọnwụ kulie.