Full Lyrics
CHORUS
Aja nke eluobe n'aja nke Altar b'otu ihe
maka n'ọ bụ Kristi n'onwe ya bụ Onye nchụaja
bụrụkwa ihe 'ji achụ ya
N'elu obe ọ n'agba mmee
ma n'egbua n'altar dị ngọzi
site n'igbu'ko nd'Ụkọchukwu
Ọ naghị agbazi mmee
VERSE 1
N'oriri Ikpeazụ
ka Kristi dobere Eucharistia dị nso
na ya ka Ọ nyere iwu a
mebenu nkea n'ncheta nkem o.
VERSE 2
Leenu Onyenwe anyị
ka Ọ nọ n'altar Ụkọchukwu
anya kwenyere riezie
na ọ bụ ụzọ nzọpụta anyị
VERSE 3
Kanyị sonye Kristi
n'aja nke Missa ọ bụ aja ka sịnso
n'ihi n'ọ bụ ụzọ anyị g'esi zute Nna n'eluigwe
VERSE 4
Leenwa Chukwu nwa
ka ọ si gbasa aka ya n'obe
Ọ naasị ndị njọ bịa naranụ ndụ Ọ kpụ
VERSE 4B (SOLO CHANT)
Ihe omimi dị nso di elu dị n'igbu'ko nd'ụkọchukwu
Achịcha na mmanya ka n'erugharị n'ọ g'adị dị nso site n'ak'ụkọchukwu
Onye nọchiri anya Dinwenu anyị n'ichunyere chukwu aja dị akpụ
nk'a naghị agbazi mmee Ọ naghị agbazi mmee
Ọ naghị agbazi mmee